33 Ì mawo ukpuru nile nke elu-igwe? Ma-ọbu ì nēdo ndozi-okwu-ya n'uwa?
33 Ị maara iwu na-achị ihe niile dị na mbara eluigwe? Ị pụrụ inye ha ike ịchị ụwa?
Chineke we kpua ihe uku abua ahu nke nēnye ìhè; Ọ kpuru ihe ahu nēnye ìhè nke ka uku ka ọ nāchi ehihie, na ihe ahu nēnye ìhè nke ka ntà ka ọ nāchi abali: Ọ kpukwara kpakpando nile,
Rue ubọchi nile nke uwa, ọghigha-nkpuru na owuwe-ihe-ubi, na oyi na okpom-ọku, na udumiri na ọkọchi, na ehihie na abali, agaghi-ebì.
Ì nēme ka Mazzaroth puta na mb͕e-ya? Ma-ọbu ì nēdu Bear na umu-ya?
O we me ka ha guzo rue mb͕e nile ebighi-ebi: Ukpuru ka Ọ nyeworo nke na-agaghi agabiga.
Otú a ka Jehova siri: Ọ buru na ọb͕ub͕a-ndum nke ehihie na abali adighi, ọ buru na atọghm ukpuru nile nke elu-igwe na uwa;