Nyenu Jehova, bú Chineke-unu, nsọpuru, tutu O me ka ọchichiri b͕a, na tutu ukwu-unu akpọbì ukwu n'elu ugwu chi-ojiji; unu we le anya ìhè, ma O mewo ya ka ọ ghọ onyinyo ọnwu, O mewo kwa ka ọ b͕a oké ọchichiri.
N'ihi na, le, Onye nākpu ugwu nile, Nke nēkè kwa ifufe, Nke nēgosi kwa madu ihe bu ntughari-uche-ya, Onye nēme chi-ọbubọ ka ọ b͕a oké ọchichiri, Nke nāzọkwasi kwa ebe nile di elu nke uwa; Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bu aha-Ya.
ka i we ghara kwa iweli anya-gi abua le elu-igwe, hu anyanwu na ọnwa na kpakpando, bú usu nile nke ihe elu-igwe, ewe duhie gi, i we kpọ isi ala nye ha, fè ha, bú ihe nke Jehova, bú Chineke-gi, kesaworo ndi nile n'okpuru elu-igwe nile.