na n'ebe anu nile ọ bula nke nwere nkpuru-obi di ndu di nke dinyere unu, nime anu-ufe, na nime anu-ulo, na nime anu-ọhia nile ọ bula nke uwa nke dinyere unu; bú nke sitere n'ihe nile nēsi n'ub͕ọ ahu puta, bú anu-ọhia nile ọ bula nke uwa.
Ọ si, Pua, guzo n'ugwu n'iru Jehova. Ma, le, Jehova nāgabiga, oké ifufe di ike nāb͕ọwa kwa ugwu nile, nētipia kwa nkume di elu nile n'iru Jehova; ma Jehova anọghi n'ifufe ahu: ma mb͕e ifufe gasiri ala-ọma-jijiji mara; ma Jehova anọghi n'ala-ọma-jijiji ahu:
M'we hu, ma, le, oké ifufe nēsi n'Ugwu bia, oké igwe-oji, na ọku nke nānwude onwe-ya mb͕e nile, onwunwu di-kwa-ra ya buruburu, ọ bu kwa n'etiti ya, bú n'etiti ọku ahu, ka ihe dika amber n'ile ya anya nēb͕upu.
Jehova adighi-ewe iwe ọsọsọ, Ọ di kwa uku n'ike, ma ọ dighi uzọ ọ bula Ọ gāgu ndi ikpe mara na ha bu ndi ikpe nāmagh: Jehova, n'oké ikuku na n'oké ifufe ka uzọ-Ya di, igwe-oji bu kwa ájá ukwu-Ya abua.