9 N'ime-ulo Ndida ka oké ifufe nēsi bia: Ọ bu kwa n'Ugwu ka oyi nēsi bia.
9 Oke ifufe na-esite nʼụlọ ya na-abịa, oyi na-esitekwa nʼikuku na-agbasa agbasa.
Jehova we si n'oké ifufe za Job, si,
Onye nēme Bear, na Orion, na Pleiades, Na ime-ulo nke Ndida.
Onye nēdo ihe-njikọta nke ime-ulo-elu-Ya nile nime miri: Onye nēme igwe-oji ka ha buru ub͕ọ-ala-Ya; Onye nējeghari n'elu nkù abua nke ifufe:
Ọ nātupu ice-Ya dika iberibe achicha: Ònye gēguzo n'iru oyi-Ya?
Ifufe Ugwu nāmuputa oké miri-ozuzo: Ọ bu kwa iru oké iwe ka iré nēkwu okwu-azu nāmuputa.
Ibu eboro ọzara nke oké osimiri. Dika oké ifufe nke di nime Negeb nēfebiga, n'ọzara ka o siworo bia, site n'ala di egwu.
Ọ bu kwa Jehova ka agāhu n'elu ha, àkú-Ya gāpu kwa dika àmùmà: Onye-nwe-ayi Jehova gāfù kwa opì-ike, je ije n'oké ifufe di iche iche nke Ndida.