Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 37:22 - Bible Nso

22 N'Ugwu ka ọla-edo, bú ọmùmù-ìhè, nēsi bia: Chineke ka ebube di egwu nādikwasi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Nʼugwu ka ebube na-enwu dịka ọlaedo si apụta; Chineke na-eji ebube dị egwu na-abịa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 37:22
22 Iomraidhean Croise  

Jehova, Gi nwe idi-uku, na idi-ike, na ima-nma, na nmeri, na ebube: n'ihi na ihe nile di n'elu-igwe na n'uwa bu nke Gi; Jehova, Gi nwe ala-eze, Gi bu kwa Onye anēweli elu iburu ihe nile onye-isi.


Ma ub͕u a madu ahughi ìhè nke nēb͕upu na mbara-ígwé: Ifufe we gabiga, me ka ha di ọcha.


Onye puru ime ihe nile, ayi achọputaghi Ya; Ọ di uku n'ike: N'ikpe na iba-uba nke ezi omume Ọ dighi-eweda n'ala.


Biko, were nbili-elu na idi-elu chọ onwe-gi nma; Were kwa ebube na ima-nma yikwasi onwe-gi.


Gọzie Jehova, nkpuru-obim. Jehova, Chinekem I di uku nke-uku; Ebube na ima-nma ka I yiriworo dika uwe.


N'ima-nma nke nsọpuru nke ebube-Gi, Na n'oké ọlu-Gi nile, ka m'gātughari uche.


Olu Jehova nāda n'ike; Olu Jehova nāda n'ima-nma.


Jenu, hu ọlu nile nke Chineke; Onye di egwu ka Ọ bu n'omume-Ya n'ebe umu madu nọ.


Onye anātu egwu ka Chineke bu site n'ebe nsọ Gi nile: Chineke nke Israel, Ya onwe-ya nēnye ndi-Ya ike na ume. Onye agọziri agọzi ka Chineke bu.


Ọ nēb͕ochi mọ ndi-ndú: Ọ bu onye anātu egwu n'ebe ndi-eze uwa nọ.


Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha, Ònye di ike dika Gi, Ja? Ikwesi-ntukwasi-obi-Gi di kwa Gi buruburu.


Jehova bu eze; idi-elu ka O yiriworo dika uwe; Jehova eyiriwo uwe, O werewo ike ke Onwe-ya n'úkwù: Ọzọ, elu-uwa dum madu bi nēguzosi ike, adighi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya.


Ifufe Ugwu nāmuputa oké miri-ozuzo: Ọ bu kwa iru oké iwe ka iré nēkwu okwu-azu nāmuputa.


Ba n'oké nkume, zobe kwa onwe-gi n'ájá, ipu n'iru oké egwu Jehova, na ipu n'ima-nma nke idi-elu-Ya.


Madu gābà kwa n'ọb͕à nile nke oké nkume nile, na n'olùlù nile nke ájá, ipu n'iru oké egwu Jehova, na ipu n'ima-nma nke nbili-elu-Ya, mb͕e O biliri ime ka uwa ma jijiji nke-uku.


Ọ gēguzo kwa, zùa ìgwè aturu-ya n'ike nke Jehova, na nbili-elu nke aha Jehova, bú Chineke-ya: ha gēbiri kwa; n'ihi na ub͕u a ka ọ gādi uku rue nsọtu nile nke uwa.


Jehova adighi-ewe iwe ọsọsọ, Ọ di kwa uku n'ike, ma ọ dighi uzọ ọ bula Ọ gāgu ndi ikpe mara na ha bu ndi ikpe nāmagh: Jehova, n'oké ikuku na n'oké ifufe ka uzọ-Ya di, igwe-oji bu kwa ájá ukwu-Ya abua.


Onye, ebe Ọ bu nnwupu nke ebube-Ya na onyinyo nke udi-Ya, ebe O nēbu kwa ihe nile site n'okwu nke ike-Ya, mb͕e Ọ sachasiri nmehie nile ayi, O we nọdu n'aka-nri nke Idi-uku ahu di n'elu;


n'ihi na Chineke-ayi bu ọku nērechapu.


Onye nání Ya bu Chineke, buru kwa Onye-nzọputa-ayi, ka ha site n'aka Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi, diri Ya, bú otuto na idi-uku na ike na ichi-isi, mb͕e oge a nile akērughi, ub͕u a kwa, we ru kwa mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan