14 Ṅa nti na nka, Job: Guzo, ghọta oké ọlu nile nke Chineke.
14 “Job, gee ntị. Tulee ọrụ ebube niile Chineke na-arụ.
Cheta ka i me ọlu-Ya ka ọ di uku, Bú nke madu bùworo abù bayere ya.
Ma ọ bu n'ihi nkpa-n'aka, ma-ọbu n'ihi uwa-Ya, Ma-ọbu n'ihi ebere, ka Ọ nēme ka ọ biarue.
Ì mara otú Chineke nēnye ha iwu, Nēme kwa ka ìhè igwe-oji-Ya mua?
Ì mara otú oké igwe-oji ji kwuru efekefe, Oké ọlu nke Onye zuru okè n'ọmuma-ihe?
Chineke nēji olu-Ya ma éb͕è-elu-igwe n'uzọ di ebube; Ọ nēme ihe uku, ma ayi amaghi ha.
Onye nēme ihe uku, nke ngwuputa ala-ha nādighi; Oké ọlu rue mb͕e ọnu-ọgugu adigh:
Ọlu nile nke Jehova di uku, Buru ihe ndi nile ha nātọ utọ nāchọputa.
Ranu aka, mara kwa na Mu onwem bu Chineke: Agēbulim n'etiti mba nile, agēbulim n'uwa.
Moses we si ndi Israel, Unu atula egwu, guzonu onwe-unu n'ebe a, hu nzọputa Jehova, nke Ọ gēmere unu ta: n'ihi na ndi Ijipt ndi unu huworo ta, unu agaghi-ahu kwa ha ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi.
Le ọlu Chineke: n'ihi na ònye puru ime ka ọ dizie, bú ihe O meworo ka ọ b͕agọ?
Ma Jehova nọ n'ulo uku Ya di nsọ: dere du n'iru Ya, gi uwa nile.