Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 36:6 - Bible Nso

6 Ọ dighi-edebe ndu nke onye nēmebi iwu: Ma Ọ nēnye ndi ewedara n'ala ezi ikpé.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Ọ naghị edebe ndị ajọ omume ndụ, kama ọ na-enye ndị a na-akpagbu akpagbu ihe ruuru ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 36:6
21 Iomraidhean Croise  

Na ọ bu rue ubọchi nhuju-anya ka anēb͕ochi onye ọjọ? Na ọ bu rue ubọchi ọnuma ka anēdupu ha?


Dika ndi nēmebi iwu ka O tiworo ha aka N'ọnọdu ndi nāhu ha anya;


Ka o we jide akuku nile nke uwa aka, Ewe si nime ya rurupu ndi nēmebe iwu?


Biko, cheta, ònye laworo n'iyì, mb͕e ya onwe-ya bu onye nēmeghi ihe ọjọ? Ma-ọbu òle ebe ezipuwo ndi ziri ezi?


O we zọputa madu na mma-agha nke sitere n'ọnu-ha, Bú ndi-ob͕eye n'aka ndi di ike.


Ndi nākpọ gi asì gēyi ihere dika uwe; Ulo-ikwū nke ndi nēmebi iwu agaghi-adi kwa.


Amawom na Jehova gēmezi okwu-ikpe onye ewedara n'ala, Na ikpé ziri ezi nke ndi-ob͕eye.


N'ezie ndi ezi omume gēkele aha-Gi: Ndi ziri ezi gēbi n'iru Gi.


Ma Gi onwe-gi, Chineke, gēme ka ha rida n'olùlù nbibi: Ndi bu ndi-ọbara na ndi-aghughọ agaghi-adiru nkera ubọchi-ha; Ma mu onwem gātukwasi obi na Gi.


Ọ gēkpe ndi ewedara n'ala n'etiti ndi-Gi ikpe, Ọ gēnye umu nke ob͕eye nzọputa, Zọpia kwa onye-nmeb͕u.


N'ihi na Onye nājuta ọbara ndi eb͕uru eb͕u echetawo ha: O chezọghi iti-nkpu nke ndi ewedara n'ala.


kama ọ gēji ezi omume kpe ndi nēnweghi ike ikpe, ọ gēji kwa izi-ezi ba nba bayere ndi di ume-ala n'obi n'uwa: ọ gēji kwa ndele nke ọnu-Ya tib͕ue uwa, ọ gēji kwa iku-ume nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua me ka ndi nēmebi iwu nwua.


Onye-nwe-ayi matara idọputa ha n'ọnwunwa, bú ndi nāsọpuru Chineke, na idebe ndi ajọ omume n'ahuhu-nmehie rue ubọchi ikpé;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan