Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 36:5 - Bible Nso

5 Le, Chineke di ike, Ọ dighi-aju kwa onye ọ bula: Ọ di ike n'ike nke obi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 “Chineke dị ike ma ọ dịghị eleda mmadụ ọbụla anya; ọ dị ike, bụrụkwa onye na-eme ihe ọbụla o zubere ime.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 36:5
17 Iomraidhean Croise  

Ọ̀ di Gi nma ka I meb͕ue nmeb͕u, Ka I ju ndọb͕u-n'ọlu nke ọbu-aka-Gi abua, We mukwasi ìhè na ndum-ọdu ndi nēmebi iwu?


Ọchichi na oké egwu di n'aka-Ya; O nēme udo n'ebe-Ya nile di elu.


Ọ buru na ajum okwu-ikpé orùm nwoke ma-ọbu orùm nwayi, Mb͕e mu na ha nēse okwu:


Onye puru ime ihe nile, ayi achọputaghi Ya; Ọ di uku n'ike: N'ikpe na iba-uba nke ezi omume Ọ dighi-eweda n'ala.


Mù onwem gēsi kwa aṅa za Ya, Rọputa kwa okwum nile m'gāgwa Ya?


Ọ buru na ayi ekwue okwu bayere ike nke onye nwe ume, le, Ọ nọ ya! Ma ọ buru na ayi ekwue okwu bayere ikpé, ònye gākaram mb͕e?


O chewo ekpere nke onye nēnweghi ihe iru, O ledaghi kwa ekpere-ha anya.


N'ihi na Jehova di elu, ma ọ bu onye di ume-ala n'obi ka Ọ nāhu anya: Ma onye-npako, Ọ nēsite n'ebe di anya mara ya.


Onye uku ka Onye-nwe-ayi bu, O nwe-kwa-ra ike riri nne; Nghọta-Ya enweghi ọnu-ọgugu.


N'ihi na O ledaghi nweda-n'ala nke onye ewedara n'ala anya, Ọ kpọghi kwa ya ihe-árú; O zonarighi kwa ya iru-Ya; Ma mb͕e o tikuru Ya, Ọ nuru olu-ya.


N'ihi na Jehova nēge nti ndi-ob͕eye, Ọ ledaghi kwa ndi-nkpọrọ-Ya.


Ike nke eze nāhu kwa ezi ikpé n'anya; Gi onwe-gi emewo ka izi-ezi guzosie ike, Ezi ikpé na ezi omume ka Gi onwe-gi meworo nime Jekob.


Onye jiworo ike-Ya me uwa, Onye jiworo amam-ihe-Ya me ka elu-uwa dum madu bi guzosie ike, Onye jiworo nghọta-Ya setipu elu-igwe:


I di uku na ndum-ọdu, di kwa ike n'omume: Onye anya-Gi ghere oghe ilekwasi uzọ nile nke umu madu; inye onye ọ bula dika uzọ-ya nile si di, na dika nkpuru omume-ya nile si di:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan