Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 36:22 - Bible Nso

22 Le, Chineke nēme Onwe-ya ka Ọ nọ n'elu n'ike-Ya: Ònye bu onye-ozizí dika Ya?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 “E buliela Chineke elu nʼike ya, onye bụ onye ozizi dịka ya?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 36:22
21 Iomraidhean Croise  

Ọ̀ di onye gēzí Chineke ọmuma-ihe? Ebe Ya onwe-ya nēkpe ndi di elu ikpe.


Ọchichi na oké egwu di n'aka-Ya; O nēme udo n'ebe-Ya nile di elu.


Le, ọ bu na nka ka i nābughi onye ezi omume; m'gāza gi: N'ihi na Chineke di uku kari madu.


Onye nēzí ayi ihe kari anu nke uwa, Ọ nēme kwa ka ayi mara ihe kari anu-ufe nke elu-igwe?


Esighm n'ikpé-Gi nile wezuga onwem; N'ihi na I zíwom ihe.


Mem ka m'zọ ije n'ezi-okwu-Gi, Gi zíkwam ihe; N'ihi na Gi onwe-gi bu Chineke nke nzọputam; Gi ka m'nēle anya Gi ogologo ubọchi nile.


Kama Chineke bu onye-ikpe: Ọ nēme otù onye ka ọ di ala, Ọ nēbuli kwa onye ọzọ elu.


Onye nādọ mba nile aka na nti, Ọ̀ gaghi-aba nba, Bú Onye nēzí madu ihe-ọmuma?


Onye ihe nāgara nke-ọma ka nwoke ahu bu nke I nādọ aka na nti, Ja, Onye I nēsi kwa n'iwu-Gi zí ihe;


Jehova anyajiwo nkpa-n'aka nke ndi nēmebi iwu, ndele nke ndi nāchi achi;


Otú a ka Jehova siri, bú Onye-nb͕aputa-gi na Onye Nsọ Israel: Mu onwem bu Jehova, Chineke-gi, Onye nēzí gi ime ihe nābà úrù, Onye nēme ka i zọ ije n'uzọ i gējeso.


Ọzọ, umu-gi nile gābu ndi-nmuta Jehova; udo nke umu-gi gāba kwa uba.


Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e agēwuru Jehova obodo a site n'ulo-elu nke Hananel rue ọnu-uzọ-ama nke nkuku.


ọ bu kwa gi ka agāchupu n'ebe madu bi, ọ bu kwa n'etiti anu ọhia ka ebe-obibi-gi gādi, ọ bu kwa ihe-ọkukú ka agēme ka i ta dika ehi, igirigi nke elu-igwe ganēde kwa gi, oge asa gāgabiga n'isi gi; rue mb͕e i gāma na Onye ahu nke kachasi ihe nile elu nāchi achi n'ala-eze nke madu, ọ bu kwa onye ọ bula Ọ nāchọ inye ya ka Ọ gēnye ya.


Aganēsi kwa n'ebe madu bi chupu gi, ọ bu kwa n'etiti anu ọhia ka ebe-obibi-gi gādi; ihe-ọkukú ka agēme ka i ta dika ehi, oge asa gāgabiga kwa n'isi gi; rue mb͕e i gāma na Onye ahu nke kachasi ihe nile elu nāchi achi n'ala-eze nke madu, ọ bu kwa onye ọ bula Ọ nāchọ ka Ọ nēnye ya.


Gi onwe-gi, eze, Chineke Nke kachasi ihe nile elu nyere Nebukadneza, bú nna-gi, ala-eze a na idi-uku na ebube na ima-nma:


O wedawo ndi di ike pua n'oche-eze-ha, Weli kwa elu ndi ọnọdu-ha di ala.


Edewo ya n'akwukwọ ndi-amuma, si, Ha nile gābu kwa ndi Chineke zíworo ihe. Onye ọ bula nke nuworo site n'ọnu Nnam, nke mutawo-kwa-ra ihe, ọ nābiakutem.


Ka nkpuru-obi ọ bula do onwe-ya n'okpuru ndi nāchi isi n'elu ya: n'ihi na ọ dighi onye ọ bula nāchi isi ma ọ buru na Chineke edoghi ya; ndi nāchi isi bu kwa ndi Chineke doworo.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan