Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 36:13 - Bible Nso

13 Ma ndi emeruru obi-ha emeru nēdo iwe n'obi: Ha adighi-etiku Chineke mb͕e O keworo ha ab͕u.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 “Ndị ajọ omume na-ebu iro nʼobi ha. Ha adịghị echegharị kpọkuo ya ọ bụladị mgbe o kere ha agbụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 36:13
15 Iomraidhean Croise  

ha we si ha, Unu agaghi-ewebata ndọta-n'agha ahu n'ebe a: n'ihi na tukwasi ikpe-ọmuma Jehova nke mara ayi, unu onwe-unu nāsi na unu gātukwasi ihe na nmehie nile ayi na n'ikpe-ọmuma-ayi: n'ihi na o riri nne, bú ikpe-ọmuma mara ayi, iwe di ọku di kwa n'aru Israel.


Ma na mb͕e nkpab͕u ahu akpab͕uru ya, o mekpuru emekpu kari imegide Jehova, bú eze Ehaz nka.


Gini mere obi-gi ji ebupu gi? Gini me-kwa-ra anya-gi abua ji atabi?


E, gi onwe-gi nēmebi egwu, Nēbilata kwa ntughari-uche n'iru Chineke.


Ma ọ buru na ha adighi-anu ha gāla n'iyì site n'ihe-agha, Kubìe ume nēnweghi ọmuma-ihe.


Nkpuru-obi-ha nānwu na nwata, Ndu-ha nāla kwa n'iyì n'etiti ndi edoro nsọ ikwa iko.


Ma ọ buru na ejide ha n'udọ̀ nke nweda-n'ala, Dika ndi ekeworo ab͕u nime nkpọrọ-ukwu;


Nke M'b͕ochiworo nye mb͕e nkpà, Nye ubọchi ọ̀gù na agha?


Ndi nānọdu n'ọchichiri na onyinyo ọnwu, Bú ndi-nkpọrọ nke nweda-n'ala na ígwè;


Dika edeworo ya n'akwukwọ iwu Moses, ihe ọjọ a nile abiakwasiwo ayi: ma ayi emeghi ka iru Jehova, bú Chineke-ayi, dajua, ka ayi we si n'ajọ omume nile ayi chigharia, nwe uche n'ezi-okwu-Gi.


Ma, le, unu ebiliwo n'ọnọdu nna-unu-hà, nmuba nke ndikom, bú ndi-nmehie, iwere idi-ọku ọzọ tukwasi n'idi-ọku iwe Jehova megide Israel.


ma dika obi-etili-gi na obi-gi nēchègharighi si di i nākpado iwe nye onwe-gi n'ubọchi iwe na nkpughe nke ikpé ziri ezi nke Chineke;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan