Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 35:9 - Bible Nso

9 N'ihi iba-uba nke nmeb͕u ka ha nēti nkpu; Ha nētiku onye gēyere ha aka n'ihi ogwe-aka ndi di ike.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 “Ụmụ mmadụ na-eti mkpu akwa nʼihi ịba ụba nke mmegbu, ha na-arịọ arịrịọ enyemaka site nʼaka ndị dị ike.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 35:9
20 Iomraidhean Croise  

Ọ nēme ka ndi-nchu-àjà la dika onye akwatara ihe-ya nagha, Ndi nādigide ka Ọ nēme kwa ka ha kpùe iru.


N'ihi na ọ zopiawo ndi-ob͕eye, rapu kwa ha; Ọ napuwo ulo n'ike, ọ gaghi-ewu kwa ya.


Ha nēsi n'obodo ndikom sua udè, Nkpuru-obi ndi emeruworo aru nētiku Chineke: Ma Chineke adighi-agu ya n'ihe-nzuzu.


Ime ka iti-nkpu nke onye nēnweghi ike biarue Ya ruo, Iti-nkpu nke ndi ewedara n'ala ka Ọ nānu kwa.


Nmebi-iwu-gi gēmetu nwoke dika gi; Ezi omume-gi gēmetu kwa nwa nke madu.


Ma-ọbu ọ̀ bu ogwe-aka dika Chineke ka i nwere? Ọ̀ bu kwa olu dika Ya ka i gēji ma dika éb͕è-elu-igwe?


Tijie ogwe-aka nke onye nēmebi iwu; Onye ọjọ kwa, I gājuta nmebi-iwu-ya rue mb͕e I gaghi-achọta ya.


N'ihi ipunara ndi ewedara n'ala ihe, n'ihi isu-ude nke ndi-ob͕eye, Ub͕u a ka M'gēbili, ka Jehova kwuru; M'gēdo ya na nzọputa nke o nēkusi ume ike inwe.


N'ihi na Gi onwe-gi bu Chineke Nke bu ebem siri ike; n'ìhi gini ka I juworom aju? N'ihi gini ka m'nējeghari nēyi uwe-nkpe nime nmeb͕u onye-iro?


O rue, n'ọtutu ubọchi ahu, na eze Ijipt nwuru: umu Israel we nēze ume n'ihi òfùfè-ha, ha we tie nkpu, ntiku ha tikuru Chineke we rigorue Chineke nti, n'ihi òfùfè ahu.


Ọ buru na i weda ya n'ala ma-ọli, ọ we tikuem n'uzọ ọ bula n'ezie, aghaghm inu ntiku-ya;


Jehova we si, Ahuwom n'ezie nweda-n'ala nke ndim nke di n'Ijipt, anuwokwam iti-nkpu-ha n'ihi ndi nāchi ha n'ihe-ike; n'ihi na amawom ihe-nb͕u-ha nile;


Ma ub͕u a, le, iti-nkpu umu Israel eruwom nti: ọzọ kwa, ahuwom nmeb͕u nke ndi Ijipt nēmeb͕u ha.


Mu onwem we legharia anya bu nmeb͕u nile anēmeb͕u n'okpuru anyanwu: ma, le, anya-miri nke ndi anēmeb͕u, ma ọ dighi onye-nkasi-obi ha nwere; ma n'akuku ndi nēmeb͕u ha ka ike di, ma ọ dighi onye-nkasi-obi ha nwere.


Ha ejighi kwa obi-ha tikuem, kama ha nākwasi ákwá ike n'elu ihe-ndina-ha: n'ihi ọka na manya-vine ọhu ka ha nāchikọta onwe-ha, ha nēwezuga onwe-ha imegidem.


N'ubọchi-ya ka i gēnye ya ugwọ-ọlu-ya, anyanwu agaghi-adakpu kwa ya; n'ihi na onye ewedara n'ala ka ọ bu, nke ahu ka ya onwe-ya nātukwasi kwa nkpuru-obi-ya: ka o we ghara ikpọku Jehova megide gi, o we buru nmehie nime gi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan