Ha si, N'ìhi gini ka ayi būworo ọnu, ma I hughi? n'ìhi gini ka ayi wedaworo nkpuru-obi-ayi n'ala, ma I dighi-ama? Le, n'ubọchi obubu-ọnu-unu unu nāchọputa ihe nātọ unu utọ, ọ bu kwa ihe nile nke putara na ndọb͕u ndi-ọlu-unu nādọb͕u onwe-ha n'ọlu ka unu nānara n'ihe-ike.
Unu asiwo, Ọ bu ihe-efu ifè Chineke òfùfè: ọ̀ bu kwa urù gini ka ọ bara ayi na ayi edebewo ihe-ndebe-Ya, na ayi ejeghariwo kwa n'uwe-iḅa-nkpe n'iru Jehova nke usu nile nke ndi-agha?