Unu ekwe-kwa-la ka eme ka unu yie ajọ oge a: kama ka enwogha unu site n'ime ka uche-unu buru ihe ọhu, ka unu we nwaputa ihe bu ihe Chineke nāchọ, bú ezi ihe nke di kwa Ya ezi utọ nke zu-kwa-ra okè.
O rue, na onye ọ bula nke nāhu ya anya siri, Ọ dighi mb͕e emere ka ihe di otú a di, ahughi kwa ihe di otú a site n'ubọchi umu Israel siri n'ala Ijipt rigota rue ta: tukwasinu uche na ya, b͕anu ìzù, kwu-kwa-nu okwu.