Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 34:27 - Bible Nso

27 N'ihi na ha esiwo n'iso Ya wezuga onwe-ha, Ha eweghi kwa uche le uzọ-Ya nile anya:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

27 nʼihi na ha sitere nʼiso ya wezuga onwe ha, ha enweghịkwa uche ilebanye anya nʼụzọ ya ọbụla.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 34:27
18 Iomraidhean Croise  

Peka nwa Remalaia b͕uru nime Juda orú nnù ndikom uzọ iri-na-ise n'otù ubọchi, ha nile bu ndi-dìnkpà; n'ihi na ha rapuru Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha.


Ha we si Chineke, Si n'ebe ayi nọ wezuga Onwe-gi; N'ihi na ọmuma uzọ-Gi nile atọghi ayi utọ.


Onye ọ bula nke mara ihe gāriba kwa ihe ndia ama, Ha gātukwasi kwa uche n'ebere nile nke Jehova.


Ma ndi nēwezuga onwe-ha ije n'uzọ nile ha b͕agọro ab͕agọ, Jehova gēme ka ha na ndi nālu ajọ ihe yikọ la. Ka udo dikwasi Israel.


N'ihi na ha adighi-aghọta ọlu nile nke Jehova, Na n'ihi na ha adighi-aghọta ihe aka-Ya abua meworo, Ọ gākwada ha, Ọ gaghi-ewulita ha elu dika ulo.


Idọ-aka-na-nti ọjọ diri onye nārapu uzọ: Onye nākpọ iba-nba asì gānwu.


Ma ntipia nke ndi nēmebi iwu na ndi-nmehie gādi n'otù, agēme kwa ka ndi nārapu Jehova gwusia.


Ehi mara onye-nwe-ya, inyinya-ibu ma-kwa-ra ebe-ọzùzù-anu nke onye-nwe-ya: ma Israel amaghi, ndim atukwasighi uche.


Ubọ-akwara na une na egwú-otiti na ọ̀jà na manya-vine di kwa n'ọṅuṅu-manya-vine-ha nile: ma ha adighi-elegide ọlu Jehova anya, ha ahughi kwa ihe aka-Ya abua nēme.


Ọ̀ bughi nka ka i nēmere onwe-gi, n'irapu Jehova, bú Chineke-gi, mb͕e Ọ nēme ka i je ije n'uzọ?


na ndi si n'iso Jehova laghachi azu; na ndi nāchọghi Jehova, nājughi kwa ase Ya.


Ma ọ dighi Pọl nma ka ha kuru onye ahu ka ya na ha yikọ je, bú onye si na Pamfilia rapu ha laghachi, ghara iso kwa ha je ọlu-ha.


n'ihi na Dimas rapuru náním, ebe ọ huru oge di ub͕u a n'anya, o we ga Tesalọnaika; Kresens gara Galetia, Taitọs gara Dalmetia.


Ma ayi onwe-ayi adighi n'etiti ndi wezugara onwe-ha ila n'iyì; kama ayi di n'etiti ndi kwere ekwe inweta nkpuru-obi-ha.


Echeghariwom na emewom Sọl eze: n'ihi na o siwo n'isom n'azu laghachi, ma o meghi ka okwum guzosie ike. Iwe Samuel we di ọku; o we tikue Jehova nkpu abali ahu nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan