Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 34:26 - Bible Nso

26 Dika ndi nēmebi iwu ka O tiworo ha aka N'ọnọdu ndi nāhu ha anya;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

26 Nʼebe mmadụ niile ga-ahụ ha ka ọ na-ata ha ahụhụ nʼihi ajọ omume ha,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 34:26
16 Iomraidhean Croise  

Ọ dighi-edebe ndu nke onye nēmebi iwu: Ma Ọ nēnye ndi ewedara n'ala ezi ikpé.


Ka o we jide akuku nile nke uwa aka, Ewe si nime ya rurupu ndi nēmebe iwu?


Jehova n'anwa onye ezi omume: Ma onye nēmebi iwu na onye nāhu ihe-ike n'anya ka nkpuru-obi-Ya nākpọ asì.


I basiwo mba nile ọzọ nba, I mewo ka ndi nēmebi iwu la n'iyì, I hichapuwo aha-ha rue mb͕e nile ebighi-ebi.


Jehova we zọputa Israel n'aka ndi Ijipt n'ubọchi ahu; Israel we hu ndi Ijipt ka ha nwuru anwu n'usọ oké osimiri.


Ma ntipia nke ndi nēmebi iwu na ndi-nmehie gādi n'otù, agēme kwa ka ndi nārapu Jehova gwusia.


Ha gāpu kwa, lekwasi ozu nile nke ndi nējehie ejehie megidem: n'ihi na ikpuru-ha agaghi-anwu, ọku-ha agaghi-anyu kwa; ha gābu-kwa-ra anu-aru nile ihe isọ oyi.


Ha gēsure kwa ulo-gi nile n'ọku, meso gi ihe nile ekpere n'ikpe n'anya ọtutu ndinyom; M'gēme kwa ka i kwusi ikwa iko; ọzọ, i gaghi-enye kwa onyinye ọzọ.


Ndikom nile nke obodo-ya gēwere nkume tub͕ue ya, ka ọ we nwua: i we kpochapu ihe ọjọ ahu n'etiti gi; Israel nile gānu kwa, we tua egwu.


Nātu ndi nēmehie nmehie-ha n'anya n'iru madu nile, ka ndi fọduru we tu kwa egwu.


Nmehie madu ufọdu nāputa ìhè, n'ihi na ha buru ha uzọ nāga ikpé; ma nmehie madu ufọdu nēso kwa ha n'azu.


Ka obi nātọ gi utọ n'isi ya, gi elu-igwe, na unu ndi nsọ, na unu ndi-ozi, na unu ndi-amuma; n'ihi na Chineke kpere ikpé-unu n'aru ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan