Jehova, Gi nwe idi-uku, na idi-ike, na ima-nma, na nmeri, na ebube: n'ihi na ihe nile di n'elu-igwe na n'uwa bu nke Gi; Jehova, Gi nwe ala-eze, Gi bu kwa Onye anēweli elu iburu ihe nile onye-isi.
ọ bu kwa ndi nile bi n'uwa ka anāgu n'ihe-efu: ọ bu kwa dika O si achọ ka Ọ nēme n'usu-ndi-agha nke elu-igwe, na n'etiti ndi bi n'uwa: ọ dighi kwa onye gēti aka-Ya ihe, si Ya, Gini ka I meworo?