Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 34:11 - Bible Nso

11 N'ihi na ọlu madu ka Ọ gākwughachi ya, Na dika uzọ nwoke si di, otú a ka Ọ gēme ka ọ huta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Ọ na-akwụghachi onye ọbụla dịka ihe o mere si dị, ọ na-ewetara mmadụ dịka omume ya kwesiri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 34:11
18 Iomraidhean Croise  

Ọ nāriọ Chineke aririọ, ihe-ya we nātọ Ya utọ; O we were iti-nkpu-ọṅù hu iru-Ya: O we nyeghachi madu ezi omume-ya.


N'ihi ya Ọ nāmata ọlu nile ha; O we nēkpù ha iru n'abali, ewe zọpia ha.


Ọ bu kwa Gi nwe ebere, Onye-nwe-ayi: N'ihi na Gi onwe-gi nākwughachi madu ọ bula dika ọlu-ya si di.


Ha gēri kwa ufọdu nime nkpuru nke uzọ-ha, Ọ bu kwa ndum-ọdu nile nke aka ha gēju ha afọ.


Site na nkpuru nke ọnu onwe-ya ka afọ gēju onye ọ bula n'ezi ihe: Ọzọ, nmeso aka madu nke ọ nēmeso madu-ibe-ya, nke ahu ka agēnyeghachi ya.


Mb͕e i si, Le, ayi amaghi ihe a: Onye nātùzi obi nile, Ònye ahu adighi-aghọta? Onye nēche kwa nkpuru-obi-gi nche, Ònye ahu adighi-ama? Ọ̀ gaghi-enyeghachi kwa madu dika ọlu-ya si di?


Dika nmeso nile ha si di, otú a ka Ọ gākwughachi, ọnuma ka Ọ gākwughachi ndi nēmegide Ya, nmeso-ha ka Ọ gākwughachi ndi-iro-Ya; Ọ gākwughachi agwe-etiti nile nmeso-ha.


Mu onwem, bú Jehova, nēnyocha obi, nānwa akuru, ọbuná inye onye ọ bula dika uzọ-ya nile si di, dika nkpuru nke omume-ya nile si di.


I di uku na ndum-ọdu, di kwa ike n'omume: Onye anya-Gi ghere oghe ilekwasi uzọ nile nke umu madu; inye onye ọ bula dika uzọ-ya nile si di, na dika nkpuru omume-ya nile si di:


n'uma ka o nyeworo ego, ọ bu kwa ọmuru-nwa ka ọ naraworo: ọ̀ gādi kwa ndu? ọ gaghi-adi ndu: ihe-árú ndia nile ka o meworo: aghaghi ime ka ọ nwua; ọbara-ya gādi ya n'isi.


N'ihi na Nwa nke madu gaje ibia n'ebube nke Nna-Ya, Ya na ndi-mọ-ozi-Ya; mb͕e ahu ka Ọ gēnyeghachi kwa onye ọ bula dika omume-ya si di.


Onye gēnyeghachi onye ọ bula dika ọlu-ya nile si di:


N'ihi na aghaghi ime ka ayi nile puta ìhè n'iru oche-ikpé Kraist; ka ayi nile n'otù n'otù we nāghachi íhe esitere n'aru me, dika ihe onye ọ bula mere si di, ma ọ bu ezi ihe ma-ọbu ihe nādighi nma.


Ọ buru kwa na unu akpọku Ya dika Nna, bú Onye nēkpe ikpé dika ọlu madu nile n'otù n'otù si di nēleghi madu anya n'iru, nēbinu obi n'egwu n'oge unu bi dika ọbìa:


Le, anamabia ọsọsọ; ugwọ-ọlum di kwa n'akam, inyeghachi onye ọ bula dika ọlu-ya si di.


Jehova gēnyeghachi kwa nwoke ọ bula ezi omume-ya na ikwesi-ntukwasi-obi-ya: ebe Jehova nyeworo gi n'akam ta, ma ekweghm iseti akam imegide onye Jehova etere manu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan