Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 33:9 - Bible Nso

9 Mu onwem di ọcha n'obi, nēnweghi njehie; Onye nācha ucha ka m'bu, ajọ omume adighi kwa nimem:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 ‘Mụ onwe m dị ọcha nʼobi m, o nweghị ihe na-ezighị ezi m mere; adị m ọcha na-enweghị mmehie ọbụla.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 33:9
24 Iomraidhean Croise  

Ọ buru na emehiewom, I nēlezikwam anya, I gaghi-agupukwam n'ajọ omumem.


Ọ bu ezie na I mara na adighm-emebi iwu; Ọ dighi kwa onye ọ bula nānaputa n'aka-Gi.


I we si, Nmutam di ọcha, M'di kwa ọcha n'anya-Gi.


Biko, le, edowom ikpém n'usoro; Amawom na mu onwem bu onye ezi omume.


Àjọ omume na nmehie m'nwere di ole? Me ka m'mara njehiem na nmehiem.


Akachiwo njehiem akàrà n'àkpà, I we tekpue ajọ omumem ihe.


Ọ bughi n'ihi na ihe-ike di n'ọbu-akam, Ekperem di kwa ọcha.


Ibobo bayere nka gānwu ndi ziri ezi n'aru, Onye nēmeghi ihe ọjọ gākpọte kwa onwe-ya imegide onye emeruru emeru.


Ma onye ezi omume gējisi ike n'iso uzọ-ya, Onye nke aka-ya abua di ọcha ganāga n'iru n'iru n'inwe ume.


N'ihi na Ọ mawo uzọ m'nāga; Mb͕e Ọ nwaputasirim, dika ọla-edo ka m'gāputa.


Ezi omume ka m'yiri dika uwe, o we werem yikwasi onwe-ya: Ezi ikpém di ka uwe-nwuda na ákwà-ike-n'isi.


Ndikom atọ ndia we kwusi iza Job, n'ihi na ya onwe-ya bu onye ezi omume n'anya-ya.


N'ezie i kwuwo na ntim, Olu okwu nile ka m'nānu kwa, si,


N'ihi na Job siri, Abum onye ezi omume, Ma Chineke ewezugawo ikpém:


M'gēkwu okwu-ugha megide ikpém? Ọnyá-àkum adighi ngwọta, ọ bu ezie na njehie adighi.


Ọ̀ bu nka ka i nēchè na ọ bu ikpé-gi? Ma-ọbu Ì siwo, Ezi omumem kariri nke Chineke?


Ma gini mere I nādighi-ebupu njehiem, me ka ajọ omume gabiga? N'ihi na ub͕u a m'gēdina n'ájá: I gāchọsikwam ike, ma m'gaghi-anọ.


Bú Onye nēji oké ifufe chifiam aru, Onye nēme kwa ka ob͕ub͕u-mmam, bú nke eb͕urum, ba uba n'efù.


Onye zuru okè ka m'bu; adighm-amara nkpuru-obim; Ajum ndum.


Ọ buru na utari eme ka madu nwua n'otù ntabi-anya, Ọ gāchì onwunwa onye nēmeghi ihe ọjọ ọchì.


Anamatu ujọ ihe-nb͕um nile, Amawom na I gaghi-agum n'onye nēmeghi ihe ọjọ.


Ma i siri, Emeghm ihe ọjọ; n'ezie iwe-Ya esiwo n'arum laghachi. Le, Mu na i ganēje n'ikpé, n'ihi na i siri, Emehieghm.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan