Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 33:6 - Bible Nso

6 Le, mu onwem di ka i si di n'ebe Chineke nọ: Site n'urọ ka akpurum, ọbuná mu onwem.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Mụ onwe m dị ka i si dị nʼihu Chineke; mụ onwe m bụkwa ihe esitere nʼụrọ kpuo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 33:6
15 Iomraidhean Croise  

Jehova, bú Chineke, we were ájá sitere n'ala kpuọ madu, O we kuo ume ndu nye n'oghere-imi-ya abua; madu ahu we ghọ nkpuru-obi di ndu.


n'ọsusọ iru-gi ka i gēri nri, rue mb͕e i gālata n'ala; n'ihi na esiri na ya weputa gi; n'ihi na ájá ka i bu, ọ bu kwa ájá ka i gālata.


Iwe Jekob we di ọku megide Rechel: ọ si, Ọ̀ bu n'ọnọdu Chineke ka m'nọ, Onye b͕ochiworo gi nkpuru nke afọ?


Biko, cheta na dika urọ ka I kpuworom; Ì gēme kwa ka m'laghachi n'ájá?


Okwu-ncheta nile unu bu ilu nke ntu, Ihe-nb͕ochi urọ ka ihe-nb͕ochi nile unu bu.


Ma mu onwem, Onye Nke puru ime ihe nile ka m'gāgwa okwu, Ọ nātọkwam utọ isoro Chineke ru uka.


N'ojuju nke ozùzù-ya nkpà nākpà ya: Aka onye ọ bula nke nọ n'ọnọdu ọjọ gābiakwasi ya.


Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na enwerem onye gēgem nti! (Le, akàràm, ka Onye puru ime ihe nile zam;) Ọ gādikwam nọ̄ nma ma asi na enwerem akwukwọ nke o deworo, bú nwoke mu na ya nēse okwu!


Ò gesi kwa aṅa ghara ibo kari ndi bi n'ulo urọ? Nke ntọ-ala-ha di n'ájá, Ndi anāzọpia azọpia dika nla.


Ya onwe-ya gāgwara gi ndim okwu: ọ gēru kwa, na ya onwe-ya gāburu gi ọnu, gi onwe-gi gābu-kwa-ra ya Chineke.


Ma ayi nwere àkù a n'ite ájá, ka ọkika nke ike ahu we buru nke Chineke, ghara kwa isite n'ayi onwe-ayi;


N'ihi na ayi matara na asi na akwaturu ulo nke uwa, bú ulo-ikwū-ayi, ayi nwere ulo ewuru nke sitere na Chineke, ulo anējighi aka wu, di ebighi-ebi, n'elu-igwe.


Ya mere ayi bu ndi-ukọ̀ n'ọnọdu Kraist, dika agāsi na Chineke nāriọ aririọ site n'aka-ayi: ayi nọ n'ọnọdu Kraist nāriọ unu, menu ka unu na Chineke di n'otù.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan