Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 33:23 - Bible Nso

23 Ọ buru na mọ-ozi anọ n'akuku ya, Bú onye-nsughari, otù onye n'etiti nnù ndi-mọ-ozi abua na ọgu iri, Igosi madu izi-ezi-ya;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Ma a sị na e nwere mmụọ ozi nọ ya nʼakụkụ, dịka onye nkwuchite ọnụ, otu onye nʼetiti puku mmadụ, onye ga-agwa mmadụ ihe ziri ezi nye ya,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 33:23
32 Iomraidhean Croise  

Ha si ya, Nrọ ka ayi rọworo, ọ dighi kwa onye nākọ isi-ya. Josef we si ha, Ọ̀ bughi Chineke nwe akukọ-isi nrọ nile? biko, kọrọnu m.


Ma Gi onwe-gi bu onye ezi omume bayere ihe nile nke biakwasiworo ayi; n'ihi na ihe bu ezi-okwu ka I meworo, ma ayi onwe-ayi emebiwo iwu:


Gosi gi ihe-nzuzo nile nke amam-ihe, Na ọ di okpukpu n'izube ihe. Gi mara kwa na Chineke nēme ka echezọrọ gi ufọdu nime ajọ omume-gi.


N'ihi nka, unu ndi nwere obi, genum nti: Ya buru Chineke ihe-árú, bú imebi iwu; Ya buru kwa Onye puru ime ihe nile ihe-árú, bú ime ajọ omume.


E, n'ezie, Chineke agaghi-emebi iwu, Onye puru ime ihe nile agaghi-eme kwa ka ikpé buru ajọ omume.


Ihe m'nāhughi, Gi onwe-gi zím ya: Ọ buru na emewom ajọ omume, m'gaghi-eme kwa ya ọzọ?


Otú ọ di, mb͕e i nāsi na i dighi-ekiri Ya, Okwu-ikpe-gi di n'iru Ya, i gēchere kwa Ya.


M'gēsi n'ebe di anya bute ọmuma-ihem, Ọ bu kwa Onye kpurum ka m'gēnye ezi omume.


Onye puru ime ihe nile, ayi achọputaghi Ya; Ọ di uku n'ike: N'ikpe na iba-uba nke ezi omume Ọ dighi-eweda n'ala.


Ọ buru na ọ tọ ya utọ iso Ya je n'ikpé, Ọ gaghi-aza Ya otù okwu nime nnù okwu abua na ọgu iri.


Ọ dighi odozi-okwu di n'etiti ayi, Nke gātukwasi ayi abua aka-ya.


Jehova, amawom na ikpé-Gi nile bu ezi omume, Amawokwam na ọ bu n'ikwesi-ntukwasi-obi ka I wedaworom nala.


Onye ihe nāgara nke-ọma ka nwoke ahu bu nke I nādọ aka na nti, Ja, Onye I nēsi kwa n'iwu-Gi zí ihe;


nke nkpuru-obim nọ nāchọsi ike rue ub͕u a, ma achọputaghm ya: otù madu n'etiti nnù madu abua na ọgu iri ka m'chọtaworo; ma ọ dighi otù nwayi nime ndi ahu nile ka m'chọtaworo.


O we hu na ọ dighi onye ọ bula di; ibobo we nwua Ya n'aru na ọ dighi onye nāriọrọ ayi aririọ: ogwe-aka-Ya we wetara Ya nzọputa; ezi omume-Ya kwa, nke ahu nākwagide Ya.


N'ihi na ọ buru na O mekpa aru, ma Ọ gēnwe obi-ebere dika iba-uba nke ebere-Ya nile si di.


Jehova we mua anya n'ebe ihe ọjọ ahu di, me ka ọ biakwasi ayi: n'ihi na Onye ezi omume ka Jehova, bú Chineke-ayi, bu bayere ọlu-Ya nile nke Ọ luworo, ma ayi egeghi olu-Ya nti.


Hagai, bú onye-ozi Jehova, we gwa ndi Israel okwu n'ozi Jehova, si, Mu onwem nọyere unu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


N'ihi na eḅuḅere-ọnu abua nke onye-nchu-àjà gēdebe ihe-ọmuma, ọ bu kwa iwu ka ha gāchọ n'ọnu-ya: n'ihi na onye-ozi nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha ka ọ bu.


Le, Mu nēziga onye-ozim, o gēdozi kwa uzọ n'irum Onye-nwe-unu ahu unu onwe-unu nāchọ gābiaru ulo uku Ya na mberede; ọbuná Onye-ozi ọḅuḅa-ndu ahu, Onye ihe-Ya nātọ unu utọ, le Ọ nābia, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.


Filip we b͕akuru ya, we nu ya ka ọ nāgu akwukwọ Aisaia onye-amuma, o we si, Ì nāmata ihe i nāgu?


Ma ọ bu unu ndi mba ọzọ ka m'nāgwa okwu, (n'ezie, ka ọ ra, bú onye-ozi nke ndi mba ọzọ mu onwem bu, anamenye ije-ozim otuto):


Ya mere ayi bu ndi-ukọ̀ n'ọnọdu Kraist, dika agāsi na Chineke nāriọ aririọ site n'aka-ayi: ayi nọ n'ọnọdu Kraist nāriọ unu, menu ka unu na Chineke di n'otù.


Onye-ozi Jehova we si na Gilgal rigorue Bokim. Ọ we si, Emerem unu ka unu si n'Ijipt rigota, M'we me ka unu bata n'ala nke M'ṅuru nna-unu-hà iyi inye ha; M'we si, M'gaghi-emebi ọb͕ub͕a-ndum rue mb͕e ebighi-ebi, bú nke Mu ńa unu b͕ara;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan