Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 33:22 - Bible Nso

22 Nkpuru-obi-ya we nābiaru nso olùlù, Ndu-ya nābiaru kwa nso ndi nēme ka anwua.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Mkpụrụobi ya na-abịaru ili nso, ndụ ha na-anọkwa nso nʼaka ndị na-ejere ọnwụ ozi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 33:22
17 Iomraidhean Croise  

Mọ-ozi we setipu aka-ya n'ebe Jerusalem di ibibi ya, Jehova we chègharia n'ihe ọjọ ahu we si mọ-ozi ahu nke nēbibi n'etiti ndi Israel, O zuwo; ub͕u a ra aka-gi. Ma mọ-ozi nke Jehova nọ n'akuku ebe-nzọcha-ọka nke Arọna onye Jebus.


Olu oké egwu di na nti-ya abua; Mb͕e ọ nọ n'udo ka onye nāpunara madu ihe gābiakute ya:


Emebiwo mọm, emewo ka ubọchim gwusia, Ílì dirim.


Ọ nēb͕ochi nkpuru-obi-ya n'ida n'olùlù, Ọ nēb͕ochi kwa ndu-ya n'igabiga site n'ihe-agha.


Ọ b͕aputawo nkpuru-obim n'igabiga ba n'olùlù, Ndum gēle kwa ìhè.


Cheta na ndum bu ifufe: Anyam agaghi-alaghachi ihu ezi ihe.


Ihe-oriri nile ọ bula ka nkpuru-obi-ha nākpọ ihe-árú; Ha we biarue nso ọnu-uzọ-ama nile nke ọnwu.


Ma ọlu madu, site n'okwu eb͕ub͕ere-onu-Gi Ka mu onwem leziworo uzọ nile nke onye nēme ihe-ike anya.


Jehova, I mewo ka nkpuru-obim si n'ala-mọ rigoputa: I mewo ka m'si n'etiti ndi nārida n'olùlù di ndu.


N'ihi na Jehova gāgabiga iti ndi Ijipt ihe; ma mb͕e Ọ huru ọbara ahu n'elu elu-uzọ na n'elu awara-uzọ abua, Jehova gāgabiga ọnu-uzọ ahu, Ọ gaghi-ekwe onye-nbibì ahu ka ọ ba n'ulo-unu iti unu ihe.


Mu onwem siri, Ọ bu n'idi-jū nke ubọchim nile ka m'ghaghi ila n'ọnu-uzọ-ama nke ala-mọ. Anapuwom arọm fọduru afọdu.


Ngwa ngwa mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi we tie ya ihe, n'ihi na ọ nyeghi Chineke otuto ahu: ikpuru we tab͕ue ya, o we kubìe ume.


Unu atamu-kwa-la, dika ufọdu n'etiti ha tamuru, onye-nbibi ahu we la ha n'iyì.


Ha nwere mọ-ozi ahu nke abyss ahu dika eze-ha: aha-ya n'asusu Hibru bu Abadon, n'asusu Grik o nwe-kwa-ra aha Apọlion.


Jehova nēme ka anwua, Ọ nēme kwa ka adi ndu: Ọ nēme ka arida rue ala-mọ, Ọ nēme kwa ka arigota.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan