Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 32:13 - Bible Nso

13 Lezienu anya ka unu ghara isi, Ayi achọtawo amam-ihe; Chineke gāchipu ya, ọ bughi madu:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Unu ekwula sị, ‘Anyị achọtala amamihe; ka Chineke na-abụghị mmadụ gosi ya mmehie ya.’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 32:13
23 Iomraidhean Croise  

na m'gaghi-ewere ihe ma-ọli nime ihe ọ bula nke i nwere, site n'ogho we rue eriri-akpukpọ-ukwu, ka i we ghara isi, Mu onwem emewo Abram ka ọ buru ọgaranya.


o si, Ọtọ ka m'b͕ara si n'afọ nnem puta, ọtọ ka m'gāb͕a kwa laghachi n'ebe ahu: Jehova nyere, Jehova anarawo kwa; ka aha Jehova buru ihe agọziri agọzi.


N'ezie unu onwe-unu bu ndi bu ihe, Unu na amam-ihe gānwukọ n'otù.


Merenum amara, merenum amara, unu onwe-unu, bú ndi-eyìm; N'ihi na aka Chineke emetuwom n'aru.


Maranu ub͕u a na Chineke merem ka m'bagọ ab͕agọ, Na O siwo-kwa-ram ọnyà-Ya buruburu.


Ọ si ya, Dika otù nime ndinyom nzuzu si ekwu, otú a ka i nēkwu. Àyi gānara kwa ezi ihe n'aka Chineke, ghara inara ihe ọjọ? Nihe a nile Job ejighi eb͕ub͕ere-onu-ya mehie.


Ka ọhia-ogwu puta n'ọnọdu ọka wheat, Ka ahihia nēsì ísì ọjọ puta kwa n'ọnọdu ọka barley. Okwu Job agwusia.


E, anamelekwasi unu anya, Ma, le, ọ dighi onye nēso Job ru uka, Ma-ọbu nke nāza okwu-ọnu-ya nile, n'etiti unu.


N'ihi na o doghi okwu-ya n'usoro imegidem; M'gaghi-eji kwa okwu-ọnu-unu zaghachi ya.


Site n'iku-ume Chineke ka ha nāla n'iyì, Site kwa n'ifufe nke iwe-Ya ka anēme ka ha gwusia.


N'ihi na àkú nile nke Onye puru ime ihe nile di nimem, Nke ńsí-ha ka mọm nāṅu Ihe-egwu Chineke nēdo onwe-ha n'usoro imegidem.


M'we gosi gi ya site na mb͕e ochie; tutu o me emerem ka i nuru: ka i we ghara isi, Arusim emewo ha, ọ bu kwa arusim apiri api na arusim awuru awu nyere ha iwu.


Ub͕u a ka ekèworo ha, ọ bughi site na mb͕e ochie; ọzọ, tutu ubọchi ta erue i nughi kwa ha;ka i we ghara isi, Le, amaram ha.


Ahuhu gādiri ndi mara ihe n'anya ha onwe-ha, ndi nēle kwa onwe-ha anya na ha bu ndi-nghọta!


Otú a ka Jehova siri, Ka onye nke mara ihe ghara inya isi n'amam-ihe-ya, ka dike ghara inya isi n'idi-ike-ya, ka ọgaranya ghara inya isi n'àkù-ya:


le, onye nke mara ihe ka i bu karia Daniel; ọ dighi ihe-nzuzo ha zonariworo gi:


Jehova gēbu kwa uzọ zọputa ulo-ikwū nile nke Juda, ka ima-nma nke ulo Devid na ima-nma nke ndi bi na Jerusalem we ghara idi uku n'elu Juda.


Jisus zara ya, si, I gaghi-enwe ike ọ bula imegidem, ọ buru na esighi n'elu nye gi ya-ri: n'ihi nka onye raram nye n'aka-gi nwere nmehie kari.


Ka onye ọ bula ghara ighọb͕u onwe-ya. Ọ buru na onye ọ bula nēchè na ya bu onye mara ihe n'etiti unu n'oge a, ya ghọ onye-nzuzu, ka o we ghọ onye mara ihe.


Jehova we si Gideon, Ndi nke nēso gi baram uba inye Midian n'aka-ha, ka Israel we ghara inya isi megidem, si, Akam azọputawom.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan