Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 31:7 - Bible Nso

7 Ọ buru na nzọ-ukwum esi n'uzọ wezuga onwe-ya, Ọ buru kwa na obim ejesowo anyam abua n'azu, Ọ buru kwa na ọlu ọ bula araparawo n'ọbu-akam abua:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Ọ bụrụ na nzọ ụkwụ m si nʼụzọ wezuga onwe ya, ọ bụrụ anya m na-edu obi m, ma ọ bụkwanụ na aka m abụọ bụ ihe e merụrụ emerụ,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 31:7
16 Iomraidhean Croise  

Ọ bughi n'ihi na ihe-ike di n'ọbu-akam, Ekperem di kwa ọcha.


Ma onye ezi omume gējisi ike n'iso uzọ-ya, Onye nke aka-ya abua di ọcha ganāga n'iru n'iru n'inwe ume.


Nzọ-ukwu-Ya ka ukwum nējisi ike iso; Uzọ-Ya ka m'debeworo, adighm-ewezuga kwa onwem.


Ya burum ihe-árú ọ buru na aguam unu na ndi ezi omume: Rue mb͕e m'kubìri ume m'gaghi-esi n'ebe m'nọ wezuga izu-okèm.


Ezi omumem ka m'jideworo, m'gaghia ara kwa ya aka: Obim adighi-atam uta bayere otù n'ubọchim nile.


Ọ buru na ewerem miri snow sa arum, Were kwa nchà me ka ọbu-akam abua di ọcha;


M'gaghi-edo ihe jọb͕uru onwe-ya n'irum: Akpọwom ọlu nke ndi nējehie asì; Ọ gaghi-arapra n'arum.


Ọ buru na enyeghachiwom onye mu na ya di n'udo ihe ọjọ; (Kama nke ahu, adọputawom onye nākpab͕um n'efu:)


Ṅuria, nwa-okorọbia, na nwata i bu; ka obi-gi me kwa gi nma n'ubọchi nile nke okorọbia i bu, je kwa ije n'uzọ nile nke obi-gi, na n'ọhuhu-uzọ nke anya-gi abua: ma mara na n'ihi ihe ndia nile Chineke gēme ka i ba n'ikpé.


Ọ bu onye nējeghari n'ezi omume nile, nke nēkwu kwa okwu nile ziri ezi; nke nāju urù nmeb͕u nile, nke nētichapu ọbu-aka-ya abua n'ijide ihe-iri-ngo, nke nākwuchi nti-ya abua ka ọ ghara inu okwu bayere iwusi ọbara, nke nātachi kwa anya-ya abua ka ọ ghara ilekwasi ihe ọjọ anya;


Nwa nke madu, ndikom ndia emewo ka arusi nile ha ba n'obi-ha, ọ bu kwa ihe-isu-ngọngọ nke ajọ omume-ha ka ha tiyere na ncherita-iru ha: #M'gēkwe ka ha juam ase ma-ọli?


N'ihi na onye ọ bula n'ulo Israel, ma-ọbu onye ọ bula nime ndi-ọbìa nke nọ dika ọbìa n'Israel, nke nēkewapu onwe-ya n'isom, we me ka arusi nile ya ba n'obi-ya, nke nētiye kwa ihe-isu-ngọngọ nke ajọ omume-ya na ncherita-iru ya, we biakute onye-amuma iju ase bayerem n'aka ya; Mu onwem, bú Jehova, gāza ya n'Onwem:


Ndi-unu b͕apuru ab͕apu gēcheta kwa Mu onwem n'etiti mba nile ebe adọtara ha n'agha, mb͕e M'tiwaworo obi-ha nke nākwa iko, nke siworo n'ebe M'nọ wezuga onwe-ya, na anya-ha, nke nākwaso arusi nile ha iko: ha gāsọ kwa onwe-ha oyi n'iru ha n'ihi ihe ọjọ nile nke ha meworo n'ihe-árú nile ha.


ọ gābu-kwa-ra unu ọnu-ọnu usọ uwe, ka unu we hu ya anya, we cheta ihe nile Jehova nyere n'iwu, me kwa ha; ka unu we ghara kwa iledo otú unu gēso obi-unu, otú unu gēso kwa anya-unu, nke unu onwe-unu nēso ha ikwa iko:


Ma ọ buru na anya aka-nri gi eme gi ka i ma n'ọnyà, ghupu ya, tupu kwa ya n'aru-gi: n'ihi na ọ bara gi urù ka otù nime ihe di gi n'aru la n'iyì, ka aghara kwa itubà aru-gi dum n'ọku ala-mọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan