Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 31:4 - Bible Nso

4 Yà onwe-ya adighi-ahu uzọm nile, Gu kwa nzọ-ukwum nile ọnu?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Ọ bụ na ọ naghị ahụ ụzọ m niile, gụọkwa nzọ ukwu m niile ọnụ?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 31:4
19 Iomraidhean Croise  

Ọ we kpọ aha Jehova Nke nāgwa ya okwu, Gi onwe-gi bu Chineke nāhu uzọ: n'ihi na ọ siri, Ọ̀ bu kwa n'ebe a ka m'leworo azu Onye nāhum anya?


N'ihi na Jehova, anya-Ya nējeghari n'uwa nile, igosi Onwe-ya onye di ike n'akuku ndi obi-ha zuru okè n'ebe Ọ nọ. I bu onye-nzuzu na nka; n'ihi na site n'ub͕u a i gēnwe agha.


N'ihi na Ya onwe-ya mara madu efu: Ọ nāhu kwa ajọ ihe, mb͕e Ọ nādighi-elegide ya anya.


N'ihi na ubu a I nāgu nzọ-ukwum ọnu: Ì dighi-elezi nmehiem anya?


N'ihi na Ọ mawo uzọ m'nāga; Mb͕e Ọ nwaputasirim, dika ọla-edo ka m'gāputa.


Chineke nēme ka ọ nọ na ntukwasi-obi, ọ nādabere kwa na ya; Ma anya-Ya dikwasi n'uzọ nile ha.


N'ihi na Ya onwe-ya nēlegide ihe anya rue nsọtu nile nke uwa, N'okpuru elu-igwe nile ka Ọ nāhu ihe;


M'gēgosi Ya ọnu-ọgugu nzọ-ukwum; Dika onye-ndú ka m'gābiaru Ya nso.


N'ihi na anya-Ya dikwasi uzọ nile nke madu, Nzọ-ukwu-ya nile ka Ọ nāhu kwa.


Ọ dighi-esepu anya-Ya n'aru onye ezi omume: Ma ọbuná n'ebe ndi-eze nọ n'oche-eze Ka Ọ nēme ka ha nọkwasi rue mb͕e ebighi-ebi, ha we di elu.


Chìneke agaghi-egwuputa ala ihe a? N'ihi na Ya onwe-ya mara ihe-nzuzo nile nke obi.


N'ebe nile ọ bula ka anya abua nke Jehova di, Nēche ndi ọjọ na ndi bu ezi madu nche.


N'ihi na n'iru anya Jehova ka uzọ nile nke madu di, Okporo-uzọ-ya nile ka Ọ nēme ka ha di lari.


N'ihi na anyam abua dikwasi n'uzọ nile ha: ezopughi ha n'irum, ezobeghi kwa ajọ omume-ha pua n'iru anyam abua.


I di uku na ndum-ọdu, di kwa ike n'omume: Onye anya-Gi ghere oghe ilekwasi uzọ nile nke umu madu; inye onye ọ bula dika uzọ-ya nile si di, na dika nkpuru omume-ya nile si di:


ma ọ bu imegide Onye-nwe elu-igwe ka i buliworo onwe-gi; ọ bu kwa aria nile nke ulo-Ya ka ha chitaworo n'iru gi, gi onwe-gi na ndi-isi-gi na ndi bu nwunye-gi na ndi-iko-gi nwanyi nāṅu kwa manya-vine nime ha; ọ bu kwa chi nile nke ọla-ọcha, na nke ọla-edo, na nke ọla, na nke ígwè, na nke osisi, na nke nkume, nke nādighi-ahu uzọ, nke nādighi-anu kwa ihe, nke nādighi-ama kwa ihe, ka i jaworo: ma Chineke ahu Onye ume-gi di n'aka-Ya, Onye nwe-kwa-ra uzọ-gi nile, ka i nāsọpurugh:


Nataniel si Ya, Òle ebe I maram? Jisus zara, si ya, Mb͕e Filip akākpọghi gi, mb͕e i nọ n'okpuru osisi fig, ahurum gi.


Ọ dighi kwa ihe ekère èkè nke nāputaghi ihè n'iru Ya: kama ihe nile b͕a ọtọ buru kwa ihe emegheworo n'anya-Ya, bú Onye ayi gākọrọ akukọ bayere omume-ayi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan