Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 31:34 - Bible Nso

34 N'ihi na anamama jijiji ìgwè madu bara uba, Na n'ihi na nleda-anya nke ab͕uru nile nēmem ka m'tua ujọ, M'we nọ dū, ghara isi n'ọnu-uzọ pua-

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

34 nʼihi na m tụrụ egwu igwe mmadụ, si otu a, tụọ oke egwu nʼihi nleda anya nke ndị agbụrụ dị iche iche, nke mere ka m gbaa nkịtị ghara ịpụ nʼezi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 31:34
20 Iomraidhean Croise  

Ha we were oké olu kpọ ndi Jerusalem ndi nọ n'elu mb͕idi òkù n'asusu ndi-Ju, ime ka ha tua egwu, na ime ka ha ma jijiji; ka ha we were obodo-ha.


Ma otù nime umu-ndikom Joiada nwa Elaiashib, bú onye-isi-nchu-àjà, bu di nwa-nwayi Sanbalat onye Horonaim: m'we me ka ọ b͕apu n'ebe m'nọ.


Obim we duam ọdu, mu na ndi amara aha-ha na ndi nọchiri anya eze we se okwu, m'we si ha, Ọmuru-nwa ka unu onwe-unu nānara, nwoke ọ bula n'aka nwa-nne-ya. M'we nwe nkpọkọta uku megide ha.


Ndi-orù nile nke eze, na ndi ala anāchi achi nke eze, mara, na nwoke ọ bula, ma-ọbu nwayi ọ bula, nke gābakuru eze, rue ogige di ime-ime, bú onye anākpọghi, otù iwu-ya bu ka eme ka ha nwua, nāgughi onye eze nēsetiri nkpa-n'aka ọla-edo, ka ọ di ndu: ma akpọghi mu onwem ibakuru eze orú ubọchi na iri ndia.


N'ihi na ọ buru na i b͕a nkiti ghara ikwu okwu ọ bula na mb͕e a, oghere na nnaputa gēguzoro ndi-Ju site n'ebe ọzọ, ma agēme ka gi onwe-gi na ulo nna-gi la n'iyì: ma ònye mara ma ọ bu n'ihi mb͕e di otú a ka i biaruru ala-eze?


Ma nwoke nke ogwe-aka-ya di ike, ọ bu ya nwe uwa; Onye anāhu iru-ọma nēbi kwa nime ya.


Àgāsi kwa Ya otú a, bú Onye nādighi-ahu ndi-isi iru-ọma, Nke nādighi-amata kwa ọgaranya kari onye nēnweghi ike? N'ihi na ọlu nke aka-Ya ka ha nile bu.


Esola ọtutu madu n'azu ba n'ihe ọjọ di iche iche: ab͕a-kwa-la àmà bayere ise-okwu ka i we wezuga onwe-gi iso ọtutu madu n'azu iwezuga ikpé:


Ọ si ha, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, Turunu, Nwoke ọ bula n'etiti unu, ya turu mma-agha-ya n'apata-ukwu-ya, gabiganu bia-ghachi kwa site n'otù ọnu-uzọ-ama rue ọnu-uzọ-ama ọzọ n'ọmuma-ulo-ikwū a nile, b͕u-kwa-nu, nwoke ọ bula, ya b͕ue nwa-nne-ya, nwoke ọ bula, ya b͕ue eyì-ya, nwoke ọ bula, ya b͕ue onye-aru-ya.


Egwu madu nēweta ọnyà: Ma onye nātukwasi Jehova obi, agēme ka ọ nọ n'elu.


Eze, bú Zedekaia, we ṅuara Jeremaia iyi na nzuzo, si, Jehova nādi ndu, bú Onye ahu nke nyere ayi ndu a, m'gaghi-eme ka i nwua ma-ọli, m'gaghi-enye kwa gi ma-ọli n'aka ndikom ndia ndi nāchọ ndu-gi.


Eze, bú Zedekaia, we si Jeremaia, Mu onwem nātu egwu ndi-Ju ndi dakuruworo ndi Kaldea, na ha gēnyem n'aka-ha, ha ewe kwam emò.


Ọ bu n'elu ihe ọjọ ka ọbu-aka-ha abua di ime ya nke-ọma; onye-isi nāriọ, onye-ikpe ewe jikere n'ihi ugwọ; onye uku kwa, onye nēkwu ihe-ila-n'iyì nke nkpuru-obi-ya ka ọ bu: ha we tukọta ya dika udọ̀.


Ya mere ayi onwe-ayi amataghi onye ọ bula site n'ub͕u a dika anu-aru nāmata: ọbuná asi na ayi amawo Kraist dika anu-aru mara, ma ub͕u a ayi amaghi Ya ọzọ otú a.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan