N'ihi na dika n'ugwu Perazim, otú a ka Jehova gēbili; dika na ndagwurugwu Gibeon, otú a ka Ọ gēwe oké iwe; ilu ọlu-Ya - nke onye ala ọzọ ka ọlu-Ya bu; na ifè òfùfè-Ya - nke onye ala ọzọ ka òfùfè-Ya bu.
Ma ọ buru na ihe-òkìkè ọhu ka Jehova gēkè, ala ewe saghepu ọnu-ya, loda ha, ha na ihe nile ha nwere, ha we rida na ndu rue ala-mọ; unu gāmara kwa na ndikom ndia elelìwo Jehova.
Sinu n'ọnu-uzọ di warara bà: n'ihi na obosara ka ọnu-uzọ ahu di, mbara ka uzọ ahu di kwa, nke nēdubà n'ila-n'iyì, ọtutu ka ha di kwa, bú ndi nēsi na ya nābà.
Gini kwa, ma ọ buru na Chineke, ọ bu ezie na Ọ nāchọ igosi iwe-Ya, na ime ka amara ike-Ya, ma O were ogologo-ntachi-obi ri nne nagide ihe iwe edoziworo ka ha bà n'ila-n'iyì:
Ma ndi-amuma ugha putakwara ìhè n'etiti ndi Israel, dika ndi-ozizí ugha gādi kwa n'etiti unu, bú madu ndi gēwere nzuzo webata irọ-òtù di iche iche nke ila-n'iyì, nāgọnari ọbuná Onye-nwe-ha Onye b͕ara ha, ndi nēweta ila-n'iyì di ngwa tukwasi onwe-ha n'isi.
Dika Sọdọm na Gọmọra, na obodo di ha gburugburu, ebe ha rara onwe-ha nye n'ikwa-iko n'uzọ di otú ndia mere, we pua so anu-aru di iche, edebewo ha n'iru ọra madu dika ihe-ngosi, nāhu ahuhu-nmehie nke ọmuma-ikpé ziri ezi, nke bu ọku ebighi-ebi.