Otú a ka Jehova siri, Le, M'nēme ka ihe ọjọ si n'ulo-gi bilie imegide i, M'gāchiri kwa ndinyom-i n'anya-gi nye ibe-gi, ọ gēso kwa ndinyom-i dina n'anya anyanwu a.
umu nile eburu uzọ mu n'ala Ijipt gānwu kwa, site na nwa eburu uzọ muru Fero nke n-anọkwasi n'oche-eze-ya, we rue nwa o buru uzọ mu, bú nwayi nēje ozi nke nọ n'azu nkume-igwe-nri; na umu nile anumanu buru uzọ mu.
N'ihi nka ka M'gāchiri nwunye-ha nye ndi ọzọ, were kwa ubi nile ha nye ndi gēnweta ha: n'ihi na site n'onye dikarisiri ntà we rue onye dikarisiri uku onye ọ bula bu onye akpiri urù nēzighi ezi nākpọ nku, site n'onye-amuma we rue onye-nchu-àjà onye ọ bula nēme ihe n'ugha.