29 M'ghọworo nkita-ọhia nwa-nne, Ghọ-kwa-ra enyi-nnunu eyì.
29 Abụrụla m nwanne nkịta ọhịa; onye ya na ikwighịkwighị na-esogharị.
Ọ buru na akpọwom olùlù òkù, si, Nnam ka i bu; Kpọ kwa ikpuru òkù, si, Nnem na nwa-nnem nwayi ka i bu;
Eyirim okwolo nke ọzara; Aghọwom ihe dika okwukwu nke nkpọnkpọ ebe.
Amuruwom anya, we ghọ Ihe dika nnunu ntà nke nání ya nọ n'elu-ulo.
Na I gwepiawo ayi n'ọnọdu nkita-ọhia, Were kwa onyinyo ọnwu kpuchie ayi.
Ogwu gēpú kwa n'ulo-elu-ya nile, akuba na ọhia-ogwu n'ebe-ya nile ewusiri ike: o we ghọ ebe-obibi nkita-ọhia, ogige nke diri enyi-nnunu.
Dika eleke ma-ọbu ub͕ala, otú a ka m'nēbe ebe; Anamekwo ákwá dika nduru: anyam abua atalatawo n'ile anya n'elu; Jehova, anēmeb͕um emeb͕u, nọrọm mbe.
N'ihi nka ka m'gēti aka n'obi, kwasie ákwá ike, jegharia buru onye yipuworo uwe b͕a ọtọ: m'gēme ikwa-ákwá dika nkita-ọhia, na iru-újú dika enyi-nnunu.
ma Isọ ka M'kpọworo asì, me ugwu-ya nile ka ha ghọ ebe tọḅọrọ n'efu, M'were ihe-nketa-ya nye nkita-ọhia nile nke ọzara.