N'ihi na ihe ọjọ nādighi ọnu-ọgugu ab͕awom buruburu, Ajọ omumem nile eruwom aru, apughkwam ihu uzọ; Ha kariri agiri-isi nile nke isim n'uba, obim arapuwokwam.
Ihe ndia ka m'gēcheta, wusi kwa nkpu tu-obim nimem dika miri, Otú m'nāgabiga n'etiti ìgwè madu, nējere ha nwayọ dika onye-ndú-ha rue ulo Chineke, N'olu iti-nkpu-ọṅù na nke ekele, bú ìgwè madu nēme ememe.
N'ihi nka ka M'gēkère ya òkè n'etiti ndi bara uba, o gēso kwa ndi nwere ume kèsa ihe ọ kwatara n'agha; n'ihi na ọ b͕apuru nkpuru-obi-ya dika miri nye ọnwu, ọ bu kwa na ndi-njehie ka aguru ya: ma ya onwe-ya bupuru nmehie ọtutu madu, ọ bu kwa ndi-njehie ka ọ nāriọrọ aririọ.
Ha nāsi nne-ha, Òle ebe ọka na manya-vine di? Mb͕e ha nāda #mbà dika onye emeruru aru n'amá nile nke obodo, Mb͕e nkpuru-obi-ha nāwusi onwe-ya dika miri n'obi ndi bu nne-ha.
Hana we za, si, É-è, onye-nwem, nwayi nke mọ-ya di arọ́ ka m'bu: ọ dighi manya-vine ma-ọbu ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya m'ṅuworo, kama awusirim nkpuru-obim n'iru Jehova.