22 Ndi nāṅuri rue otite-egwú-ọṅù, Obi nātọ kwa ha utọ mb͕e ha chọtara ílì.
22 ndị jupụtara nʼọṅụ, na-aṅụrị ọṅụ mgbe ha rịdaruru nʼili?
Ma anya ndi nēmebi iwu gādala n'isi, Ebe-nb͕alaga alanariowo kwa ha n'iyì, Nkubì-ume bu kwa olile-anya-ha.
Ọkpurukpu-àjà nke ndagwurugwu gātọ ya utọ, Madu nile gādọrọ onwe-ha iso ya n'azu, Dika ndi anāpughi igu ọnu buru ya uzọ.
Ndi nēchere ọnwu, ma ọ dighi-abia; Ha nēgwu kwa ala-ya kari àkù zoro ezo;
N'ìhi gini ka O nēnye nwoke nke ezoworo uzọ-ya ìhè, Bú onye Chineke b͕ochiwo-kwa-ra ya?
Nkasi-obim we nādiru ub͕u a; M'we wulie elu n'ihe-nb͕u nke nādighi-enwe ọmiko: N'ihi na ezoghm okwu-ọnu nile nke Onye Nsọ.
Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na aririọm abia; Asi kwa na Chineke enyem olile-anyam!
Nkpuru-obim we rọputa ntọb͕u, Na ọnwu kari ọkpukpum ndia.
Mu onwem we ja ndi nwuru anwu, bú ndi nwuru anwu na mb͕e di anya gara aga, kari ndi di ndu, bú ndi ahu nke nọ na ndu rue ub͕u a;
e, ọ di nma kari ha abua, bú onye akādighi, nke nāhughi ọlu ọjọ nke aluworo n'okpuru anyanwu.
Ha gārọputa kwa ọnwu kari ndu, bú ndi nile fọduru, ndi fọduru site n'ab͕uru ọjọ a, ndi fọduru n'ebe nile M'chusaworo ha, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke ndi-agha puta.