10 N'ihi na o mechighi ọnu-uzọ afọ nke m'si nime ya puta, O zopughi kwa ọnọdu ọjọ n'anyam.
10 nʼihi na o mechighị akpanwa nne m, i zonarịkwa anya m nsogbu.
N'ihi na Jehova b͕ochisiri àkpà-nwa nile nke ulo Abimelek ike, n'ihi okwu bayere Sera, bú nwunye Abraham.
Jehova we hu na onye anākpọ asì ka Lia bu, Ọ we meghe àkpà-nwa-ya: ma Rechel bu nwayi-àgà.
Ike ndum agwuwo nkpuru-obim; Ka m'rapuru onwem ntamum; Ka m'kwue okwu n'idi-ilu nke nkpuru-obim.
Ọbuná ta nnupu-isi ka ntamum bu: Akam di arọ́ n'ihi ize-umem.
N'ìhi gini ka m'nēsighi n'àkpà-nwa nwua? N'ìhi gini ka m'nāputaghi n'afọ kubìe ume?
Ka kpakpando nile nke emumechi-ya b͕a ọchichiri: Ka ọ le anya ìhè, ìhè adighi kwa; Ka ọ ghara ile mbuboro-anya nke chi-ọbubọ anya:
Ma wezuga nkpasu-iwe n'obi-gi, me kwa ka ihe ọjọ si n'anu-aru-gi gabiga: n'ihi na okorọbia na mb͕e-dìnkpà bu ihe-efu.
n'ihi na o meghi ka m'nwua site n'afọ nnem; nnem ewe ghọrọm ílì, afọ-ya anēburum mb͕e ebighi-ebi.
ma o nyere Hana òkè madu abua: n'ihi na ọ bu Hana ka ọ huru n'anya, ma Jehova mechiri àkpà-nwa-ya.