Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 29:22 - Bible Nso

22 Mb͕e okwum gwusiri, ha adighi-ekwu kwa okwu-ha nke ub͕ò abua; Okwum nābukwasi kwa ha dika miri-ozuzo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Mgbe m kwụsịrị okwu, ha anaghị ekwukwa ọzọ. Okwu m na-ada juu na ntị ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 29:22
14 Iomraidhean Croise  

Anubìri olu ndi-ndú, Ire-ha rapa-kwa-ra n'okpo-ọnu-ha;


Ha nēcherekwam dika esi echere miri-ozuzo; Ha saghepu-kwa-ra ọnu-ha dika ọ bu inara miri-ozuzo ikpe-azu.


Manu-aṅu nke si n'ub͕ub͕ọ-manu-aṅu abusi ka eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua nābusi, nwunye ọhu nkem: Manu-aṅu na miri-ara-ehi di n'okpuru ire-gi; Ísì utọ nke uwe-gi nile di kwa ka ísì utọ Lebanon.


otú a ka ọ gēfesa ọtutu mba ọbara; n'ihi ya ka ndi-eze gēkpuchi ọnu-ha: n'ihi na ihe nke anākọghi nye ha ka ha huworo; ọ bu kwa ihe nke ha nāhughi ka ha ghọtaworo.


Nwa nke madu, che iru-gi n'uzọ Ndida, me ka okwu-gi busa dika miri-ozuzo n'ebe Ndida di, bue amuma megide oké ọhia nke ọhia ahu di na Negeb;


Nwa nke madu, che iru-gi na Jerusalem, busa okwu-gi dika miri-ozuzo n'ebe ebe nsọ ya nile di, bu kwa amuma megide ala Israel;


Mb͕e Efraim jiri ima-jijiji kwu okwu, ya onwe-ya buliri onwe-ya elu n'Israel: ma ikpe mara ya nime Beal, o we nwua.


Ma ub͕u a nuru okwu Jehova: Gi onwe-gi nāsi, Ebula amuma megide Israel, abusa-kwa-la okwu-gi dika miri-ozuzo megide ulo Aisak:


Unu abusala okwu dika miri, otú a ka ha nābusa okwu. Ha agaghi-abusará ndia okwu: okwu-ha nke nētiye n'ọnọdu-ihere agaghi-ewezuga onwe-ha.


Ha gēji kwa mma-agha b͕uchapu ala Asiria na ala Nimrod n'ọnu-uzọ-ya nile: ọ gānaputa kwa ayi n'aka Asiria, mb͕e ọ gābata n'ala-ayi, mb͕e ọ gāzọ kwa ukwu n'ókè-ala-ayi.


Ma ọ dighi onye ọ bula puru iza Ya okwu, ọ dighi kwa onye nwere anya-ike site n'ubọchi ahu iju Ya ajuju ọzọ.


Nmutam gātasi dika miri-ozuzo, Okwu-ọnum ganēruputa dika igirigi; Dika nshansha-miri n'elu ahihia ndu, Di kwa ka oké miri-ozuzo n'elu ihe-ọkukú:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan