25 Imere ifufe ihe-ọtùtù; Miri ka Ọ tùwo-kwa-ra n'ọtùtù.
25 Mgbe o hiwere ike nke ikuku, tụọkwa mmiri nʼihe ọtụtụ,
Le, Ọ nēb͕ochi miri, ha takọrọ; Ọzọ, ọ nēzipu ha, ha we kpùe uwa iru.
Ì mara otú Chineke nēnye ha iwu, Nēme kwa ka ìhè igwe-oji-Ya mua?
Òle ebe i nọ mb͕e M'tọro ntọ-ala uwa? Gosim, ma ọ buru na i mara nghọta.
Ònye doro ọtùtù-ya nile, ma asi na i mara? Ma-ọbu ònye setiri eriri-ọtùtù n'elu ya?
Ma-ọbu ònye ji ibo-ọnu-uzọ mechibido oké osimiri, Mb͕e ọ waputara dika agāsi na ọ nēsi n'àkpà-nwa puta;
Ọ bu Onye nēme ka alulu si na nsọtu uwa kwugo; O meworo miri-ozuzo àmùmà; Ọ bu Onye nēme ka ifufe si n'ulo-nkwakọba-Ya nile puta.
Ònye tùworo miri nile n'ọbu-aka-Ya, were ntù-aka tùputa elu-igwe, nagidezue ájá nke uwa na mb͕é, sì ugwu nile n'ihe-osìsì, tùa ugwu ntà nile n'ihe-ọtùtù?