Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 28:24 - Bible Nso

24 N'ihi na Ya onwe-ya nēlegide ihe anya rue nsọtu nile nke uwa, N'okpuru elu-igwe nile ka Ọ nāhu ihe;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 Nʼihi na ọ na-ahụ nsọtụ nke ụwa, na-ahụkwa ihe niile dị nʼokpuru eluigwe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 28:24
15 Iomraidhean Croise  

N'ihi na Jehova, anya-Ya nējeghari n'uwa nile, igosi Onwe-ya onye di ike n'akuku ndi obi-ha zuru okè n'ebe Ọ nọ. I bu onye-nzuzu na nka; n'ihi na site n'ub͕u a i gēnwe agha.


Ọ̀ bu anya anu-aru ka I nwere, Ma-ọbu na I nāhu dika madu si ahu?


N'ihi na Ya onwe-ya mara madu efu: Ọ nāhu kwa ajọ ihe, mb͕e Ọ nādighi-elegide ya anya.


Yà onwe-ya adighi-ahu uzọm nile, Gu kwa nzọ-ukwum nile ọnu?


N'okputu elu-igwe nile ka Ọ nēzisa ya, Ìhè-ya dikwasi kwa akuku nile nke uwa.


Ka o we jide akuku nile nke uwa aka, Ewe si nime ya rurupu ndi nēmebe iwu?


Ì ghọtawo rue obosara uwa? Gosim, ma ọ buru na i nazuwo ya.


Ònye buru uzọ nyem, nke M'gākwughachi? Ihe ọ bula nke di n'okpuru elu-igwe nile, nkem ka ọ bu.


Jehova nọ n'ulo uku Ya di nsọ, Jehova, n'elu-igwe ka oche-eze-Ya di; Anya-Ya nāhu, mbubere-anya-Ya nānwa, umu madu.


Nke nēme Onwe-ya ka Ọ di ala ilekwasi Elu-igwe na ilekwasi uwa anya.


O ji idi-ike-Ya achi rue mb͕e ebighi-ebi; Anya-Ya abua nēche mba nile nche: Ka ndi nēwezuga onwe-ha ghara ibuli onwe-ha elu. Selah


N'ebe nile ọ bula ka anya abua nke Jehova di, Nēche ndi ọjọ na ndi bu ezi madu nche.


N'ihi na ònye ledaworo ubọchi ihe ntà anya? n'ihi na ha gāṅuri ọṅu, hu nkume eji atù mb͕idi n'aka Zerubabel, bú asa ndia, ndi bu anya Jehova; ndi ahu nējeghari n'uwa nile.


M'we hu Nwa-aturu ka O nēguzo n'etiti oche-eze ahu na ihe anọ ahu nke di ndu, guzo kwa n'etiti ndi-okenye ahu, dika agāsi na eb͕uru Ya-ri, O nwe-kwa-ra mpi asa, na anya asa, nke bu Mọ asa ahu nke Chineke, bú nke ezigaworo ha n'uwa nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan