Nnam rara ihe nile nyem n'aka: ọ dighi kwa onye ọ bula mazuru Ọkpara ahu, ma-ọbughi Nna-Ya; ọ dighi kwa onye mazuru Nna ahu, ma-ọbughi Ọkpara-Ya, na onye ọ bula Ọkpara nēzube ikpughe Ya nye ya.
Onye nání Ya bu Chineke, buru kwa Onye-nzọputa-ayi, ka ha site n'aka Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi, diri Ya, bú otuto na idi-uku na ike na ichi-isi, mb͕e oge a nile akērughi, ub͕u a kwa, we ru kwa mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.