Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 27:5 - Bible Nso

5 Ya burum ihe-árú ọ buru na aguam unu na ndi ezi omume: Rue mb͕e m'kubìri ume m'gaghi-esi n'ebe m'nọ wezuga izu-okèm.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Agaghị m ekwenye na ihe unu kwuru ziri ezi; ruo mgbe m ga-anwụ, agaghị m agọnarị izuoke m.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 27:5
17 Iomraidhean Croise  

Le, Ọ gēb͕um; m'gaghi-echere: Otú ọ di, uzọm nile ka m'gāru uka n'iru Ya.


Ma onye ezi omume gējisi ike n'iso uzọ-ya, Onye nke aka-ya abua di ọcha ganāga n'iru n'iru n'inwe ume.


Jehova we si Setan, Ì tukwasiwo obi-gi n'aru orùm, bú Job? na ọ dighi onye di ka ya n'uwa, ọ bu nwoke zuru okè, zi kwa ezi, nke nātu egwu Chineke, nēsi kwa n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya: ọ nọ nējide kwa izu-okè-ya, ma i nākpalim imegide ya, iloda ya n'efu.


Nwunye-ya we si ya, Ì nọ nējide izu-okè-gi? b͕akuta Chineke azu, nwua.


Ezi omume ka m'yiri dika uwe, o we werem yikwasi onwe-ya: Ezi ikpém di ka uwe-nwuda na ákwà-ike-n'isi.


(Ka Ọ tùam n'ihe-ọtùtù ezi omume, Ka Chineke mara kwa izu-okèm;)


Ọ buru na nzọ-ukwum esi n'uzọ wezuga onwe-ya, Ọ buru kwa na obim ejesowo anyam abua n'azu, Ọ buru kwa na ọlu ọ bula araparawo n'ọbu-akam abua:


Ndikom atọ ndia we kwusi iza Job, n'ihi na ya onwe-ya bu onye ezi omume n'anya-ya.


Iwe Elaihu nwa Barakel, bú onye Buz, site n'ab͕uru Ram, we di ọku: megide Job ka iwe-ya di ọku, n'ihi na ọ guru onwe-ya n'onye ezi omume kari Chineke.


Ọzọ, megide ndi-eyì-ya atọ ka iwe-ya di ọku, n'ihi na ha achọtaghi ihe-ọziza ha gēji ma Job ikpe.


Mu onwem di ọcha n'obi, nēnweghi njehie; Onye nācha ucha ka m'bu, ajọ omume adighi kwa nimem:


O rue, mb͕e Jehova gwasiri Job okwu ndia, na Jehova siri Elifaz, bú onye Timan, Iwem di ọku megide gi, megide kwa ndi-eyì-gi abua: n'ihi na unu ekwughi ihe ziri ezi bayerem, dika orùm, bú Job, kwuworo.


Biko, chigharianu, ka ajọ omume ghara idi; E, chigharianu ọzọ, ezi omumem di nime ya.


Onye nāgu onye nēmebi iwu n'onye ezi omume, na onye nāma onye ezi omume ikpe, Ihe-árú n'anya Jehova ka ha abua bu n'otù.


N'ihi na inya-isi-ayi bu nka, àmà nke akọ-na-uche-ayi, na ọ bu n'idi-nsọ na idi-ọcha nke Chineke, ọ bughi n'amam-ihe nke anu-aru, kama ọ bu n'amara Chineke, ka ayi biri obi n'uwa, ma ọ bu n'ebe unu nọ ka ayi bikariri obi-ayi nke-uku.


Ma mb͕e Kifas biaruru Antiọk, eguzogiderem ya n'iru, n'ihi na ọ nọ n'ọmuma-ikpé.


Mb͕e ise-okwu di n'etiti ndikom, ha we biaru nso ka ewe kpe ikpe, ndi-ikpé we kpe ha; ha gāgu kwa onye ezi omume n'onye ezi omume, gu kwa onye nēmebi iwu n'onye nēmebi iwu;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan