M'gēme kwa ka obodo a ghọ ihe-iju-anya, ka ọ ghọ kwa ihe-ima-ọsọ; ọ gēju onye ọ bula nke nāgabiga n'akuku ya anya, ọ gāma kwa ọsọ n'ihi ihe-otiti-ya nile.
Ndi nile ndi nāgabiga n'uzọ akuwo aka megide gi; Ha amawo ọsọ̀ fufere ada Jerusalem isi, si: Ọ̀ bu nka bu obodo ahu nke anākpọ Ebe mazuru nma, Ihe-obi-utọ nke uwa nile?
N'ihi na anēdebe ukpuru nile nke Ọmri, na ọlu nile nke ulo Ehab, unu ewe jeghari nime ndum-ọdu nile ha: ka M'we me gi ka i ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, me kwa ndi bi nime-ya ka ha ghọ ihe-ima-ọsọ; ọ bu kwa ita-uta ndim ka unu gēbu.
Ọ dighi nbilata nb͕aji ab͕ajiri gi nwere; ntiputa-ọnyá-gi jọrọ njọ: ndi nile ndi nānu ihe-ọnunu bayere gi gākukpo gi aka-ha; n'ihi na ònye ka ihe ọjọ gi nāgabigaghi n'isi-ya mb͕e dum?
Nka bu obodo ahu nke nāṅuri ọṅu-agha, nke nānọ na ntukwasi-obi, nke nāsi n'obi-ya, Mu onwem nọ, ọ dighi kwa otù efu ọzọ di ma ewezuga nání mu onwem: le otú ọ ghọworo ebe tọb͕ọrọ n'efu, ebe-nmakpu diri anu-ọhia! onye ọ bula nke nāgabiga n'akuku ya gāma ọsọ, fegharia aka-ya.