Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 27:20 - Bible Nso

20 Ihe-egwu nēru ya aru dika miri; Oké ifufe ezupuwo ya n'abali.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Oke egwu na-adakwasị ya dịka idee mmiri; oke ebili mmiri na-ebufu ya nʼabalị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 27:20
17 Iomraidhean Croise  

O rue, n'abali ahu, na mọ-ozi nke Jehova puru, tib͕ue n'ọmuma-ulo-ikwū Asiria orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ atọ na nnù ndikom abua na ọgu iri: madu we bilie n'isi-ututu, ma, le, ha nile bu ozu nwuru anwu.


Olu oké egwu di na nti-ya abua; Mb͕e ọ nọ n'udo ka onye nāpunara madu ihe gābiakute ya:


Ihe-egwu emewo ka ọ tua egwu nke-uku buruburu, Ha we chugharia ya n'ukwu-ya.


Ka o rue, n'iriju afọ-ya, Na Chineke gēzitere ya idi-ọku nke iwe-Ya, Na Ọ gēme kwa ka o zokwasi ya dika miri-ozuzo nime nri-ya.


Dika nrọ ka ọ gēfelaga, agaghi-achọta kwa ya: Agēme kwa ka o fepu dika ọhù abali.


Ùb͕ò ole ka ha di ka ahihia-ọka n'iru ifufe, Na dika ib͕ob͕o-ọka nke oké ifufe nēzupu dika onye-ori?


Bú ndi apunara, ma mb͕e-ha akērughi, Ndi awusiri ntọ-ala-ha dika osimiri:


Onye di nfe n'elu miri ka ọ bu; Anākọcha òkè-ha n'uwa: Ọ dighi-eche uzọ ubi-vine iru.


N'otù ntabi-anya ka ha gānwu, ọbuná n'etiti abali; Anēme ka ndi ahu me nkpatu, ha nāgabiga kwa, Anēwezuga kwa onye di ike, nēweghi aka ọ bula.


Udọ̀ nile nke ọnwu b͕aram buruburu, Miri-iyi nile nke ihe jọb͕uru onwe-ya nēme kwa ka m'tua egwu.


Ob͕u-miri nākpọ ob͕u-miri òkù n'olu nrùda-miri nile nke Gi: Ebili-miri-Gi nile na nmali-miri-Gi nile agabigawo n'isim.


Me ka nlelì che ha iru; Ka ha we chọ aha-Gi, Jehova.


I wuchapuwo ha dika oké miri-ozuzo; nání ura ka ha bu: N'ututu ha di ka ahihia nētó etó.


O rue, n'etiti abali, na Jehova tib͕uru nwa ọ bula eburu uzọ mu n'ala Ijipt, site na nwa eburu uzọ muru Fero nke nānọkwasi n'oche-eze-ya rue nwa eburu uzọ muru onye adọtara n'agha nke nọ n'ulo olùlù; O tib͕u-kwa-ra nwa anumanu ọ bula eburu uzọ mu.


N'abali ahu ka eb͕uru Belshaza, bú eze Kaldea.


N'ihi na I tubàram nime miri di omimi, n'etiti oké osimiri nile, Osimiri dikwam buruburu; Ebili-miri-Gi nile na nmali-miri-Gi nile gabigara n'isim.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan