Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 27:2 - Bible Nso

2 Chineke nādi ndu, Onye wezugara ikpém; Onye puru ime ihe nile nādi kwa ndu, bú Onye mere ka nkpuru-obim di ilu;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 “Nʼezie, dịka Chineke na-adị ndụ, onye jụrụ ikpere m ikpe ziri ezi, Onye pụrụ ime ihe niile, onye mere ka m hụ ihe ilu nke mkpụrụobi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 27:2
26 Iomraidhean Croise  

Joab we si, Chineke nādi ndu, ọ buru na i kwughi, n'ezie mb͕e ahu site n'ututu ndim gārigowori, nwoke ọ bula site n'iso nwa-nne-ya.


Elaija, bu onye Tisbe, onye sitere na ndi-nnọdu nke Gilead, we si Ehab, Jehova, bú Chineke nke Israel, nādi ndu, Onye m'guzoworo n'iru Ya, igirigi ma-ọbu miri-ozuzo agaghi-adi ma-ọli n'arọ ndia, ma ọ bu nání dika okwum si di.


Elaija we si, Jehova nke usu nile nke ndi-agha nādi ndu, Onye m'guzoworo n'iru Ya, n'ezie ta ka m'gēme ka ọ hum anya.


O we biakute onye nke Chineke rue ugwu ahu, jide ya n'ukwu-ya abua. Gihezi we biarue nso inupu ya; ma onye nke Chineke siri, Ra ya aka: n'ihi na nkpuru-obi-ya di ilu nime ya; ma Jehova ezonariwom ya, O gosighkwam ya.


Ọ̀ di Gi nma ka I meb͕ue nmeb͕u, Ka I ju ndọb͕u-n'ọlu nke ọbu-aka-Gi abua, We mukwasi ìhè na ndum-ọdu ndi nēmebi iwu?


Chineke nēmechibidom uzọ nye ndi ajọ omume, N'aka ndi nēmebi iwu ka Ọ nātubàkwam.


Maranu ub͕u a na Chineke merem ka m'bagọ ab͕agọ, Na O siwo-kwa-ram ọnyà-Ya buruburu.


N'ihi na Chineke emewo ka obim lọ miri, Onye puru ime ihe nile emewo kwa ka m'ma jijiji:


N'ihi na Job siri, Abum onye ezi omume, Ma Chineke ewezugawo ikpém:


Ọ̀ bu nka ka i nēchè na ọ bu ikpé-gi? Ma-ọbu Ì siwo, Ezi omumem kariri nke Chineke?


Ì nēmebi kwa ikpém? I nāmam ikpe, ka i we buru onye ezi omume?


Bú Onye nēji oké ifufe chifiam aru, Onye nēme kwa ka ob͕ub͕u-mmam, bú nke eb͕urum, ba uba n'efù.


Ọ gaghi-ekwem ka m'turu ndu, Kama Ọ nēme ka afọ jum n'ihe-ilu nile.


N'ìhi gini ka i nāsi, gi Jekob, ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka i nēkwu, gi Israel, si, Uzọm ezonariworo Jehova, ọzọ, ikpém esiwo n'ebe Chinekem nọ gabiga?


Ọ gēru kwa, ọ buru na ha amuta uzọ nile nke ndim nke-ọma, iji aham ṅu iyi, si, Jehova nādi ndu; dika ha zíri ndim iji Beal ṅu iyi; agēwuli kwa ha dika ulo n'etiti ndim.


i gāṅu kwa iyi, Jehova nādi ndu, n'ezi-okwu, na n'ikpé ziri ezi, na n'ezi omume; mba nile gāgọzi kwa onwe-ha nime Ya, ọ bu kwa nime Ya ka ha gānya isi.


Ma ọ buru na ha asi, Jehova nādi ndu; n'ezie n'okwu-ugha ka ha na-aṅu iyi.


Si ha, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), ọnwu nke onye nēmebi iwu adighi-atọm utọ ma-ọli; kama ọ nātọm utọ mb͕e onye nēmebi iwu si n'uzọ-ya chigharia, we di ndu: chigharianu, sinu n'uzọ ọjọ nile unu chigharia; ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka unu gānwu, ulo Israel?


ma otù ọ di, Mu onwem nādi ndu, uwa nile gējuputa kwa n'ebube Jehova;


Nọ ọnọdu abali a, o g=eru kwa n>ututu, na ọ buru na ọ b͕aputa gi, ọ di nma; ya b͕aputa: ma ọ buru na ọ tọghi ya utọ ib͕aputa gi, mu onwem g=ab͕aputa kwa gi, Jehova n=adi ndu: dina ala rue ututu.


N'ihi na Jehova nādi ndu, Onye nāzọputa Israel; n'ezie ọ buru na ọ di nime Jonatan nwam, n'ezie ọ ghaghi inwu. Ma ọ dighi onye nāza ya okwu n'etiti ndi Israel nile.


Ndi Israel we si Sọl, Jonatan, ọ̀ gānwu, bú onye zọputara nzọputa uku a n'Israel? ya buru ihe-árú: Jehova nādi ndu, ọ dighi otù nime agiri-isi nke isi-ya gādaru ala; n'ihi na ya na Chineke aluwo ọlu ta. Ndi Israel we b͕aputa Jonatan, o we ghara inwu.


Ma, le, m'gēziga nwa-okorom, si, Je, chọta àkú nile. Ọ buru na asim nwa-okoro ahu ma-ọli, Le, àkú di n'akuku azu gi: chiri ha bia; n'ihi na udo diri gi, okwu adighi kwa, Jehova nādi ndu.


Ma ub͕u a, onye-nwem, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, ebe Jehova b͕ochiworo gi ka i ghara ibà n'ikpe-ọmuma ọbara, ka aka-gi ghara kwa izọputa gi, ub͕u a kwa ka ndi-iro-gi na ndi nāchọ ime onye-nwem ihe ọjọ di ka Nebal.


Ma otú ọ di, Jehova, bú Chineke Israel nādi ndu, Onye b͕ochiworom ka m'ghara imejọ gi, n'ezie ọ buru na i meghi ngwa bia izutem, agaghi-eme ka nwoke fọduru Nebal ma-ọli rue ìhè ututu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan