12 Le, unu onwe-unu nile ahuwo ya; N'ìhi gini kwa ka unu nāghọsi ihe-efu?
12 Unu onwe unu ahụla ihe ndị a, gịnị mere unu ji ekwu okwu ndị a na-enweghị isi?
Òkwu nke bu nání ifufe gēnwe ọgwugwu? Ma-ọbu gini nēme gi ka i di irè, na i nāza okwu?
N'ezie ikwa-emò diyerem, Anyam nānọ kwa ọnọdu-abali n'ikpasu-obi-ilu nile ha.
Nagidenum, mu onwem gēkwu kwa okwu; Ma mb͕e m'kwusiri okwu, i gāchì ọchì.
M'gēzí unu ihe site n'aka Chineke; M'gaghi-ezobe ihe nke di n'aka Onye puru ime ihe nile.
Nka bu òkè madu nēmebi iwu n'ebe Chineke nọ, Na ihe-nketa nke ndi nēme ka madu ma jijiji, nke ha nānara n'aka Onye puru ime ihe nile.
Ihe-efu di nke anēme n'elu uwa; na ndi ezi omume di, ndi ọ nādakwasi dika ọlu ndi nēmebi iwu si di; ọzọ, ndi nēmebi iwu di, ndi ọ nādakwasi dika ọlu ndi ezi omume si di: m'siri na nka bu kwa ihe-efu.