Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 26:12 - Bible Nso

12 Ike-Ya ka O ji me oké osimiri ka o dere du, Nghọta-Ya kwa ka O ji tib͕u Rehab.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Nʼike ya ka o ji kpalie oke osimiri; ọ bụ amamihe ya ka o ji tigbuo Rehab.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 26:12
16 Iomraidhean Croise  

N'aka-Ya ka amam-ihe na idi-ike di; Ọ nwere ndum-ọdu na nghọta.


Ogidi nile nke elu-igwe nāma jijiji, Ibobo nānwu ha site n'ibasi-nba-ike-Ya.


Chineke agaghi-eme ka iwe-Ya laghachi; Ndi nēyere Rehab aka ruru ala n'okpuru Ya.


Jehova nọduru n'oche-eze n'Iju-miri ahu; Jehova we nọdu dika eze rue mb͕e ebighi-ebi.


Gi onwe-gi were ike-Gi tiwa oké osimiri: I tipiara isi nile nke ogologo anu-miri n'elu miri.


N'ihi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha nwere otù ubọchi nke gādakwasi ihe ọ bula di npako nke di kwa elu, ọ gādakwasi kwa ihe ọ bula ebuliworo elu; ewe me ya ka ọ di ala:


Mu onwem bu kwa Jehova Chineke-gi, Onye nēme ka oké osimiri dere du, mb͕e nmali-miri-ya nile nēbib͕ọ: Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya.


Teta, teta, yiri ike dika uwe, gi ogwe-aka Jehova; teta, dika n'ubọchi nile nke mb͕e ochie, bú ọb͕ọ nile nke mb͕e nile ebighi-ebi gara aga. Ọ̀ bughi gi onwe-gi bu ihe ahu nke kpọwasiworo Rehab, nke mapúworo ogologo anu-miri?


Otú a ka Jehova siri, bú Onye nēnye anyanwu ka ọ buru ìhè n'ehihie, na ukpuru nile nke ọnwa na nke kpakpando nile ka ha buru ìhè n'abali, Onye nēme ka oké osimiri dere du mb͕e nmali-miri-ya nile nēbib͕ọ; Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya:


Ub͕u a mu onwem, bú Nebukadneza, nāja, nēbuli, nāsọpuru Eze nke elu-igwe; n'ihi na ọlu-Ya nile bu ezi-okwu, uzọ-Ya nile bu kwa ikpé: ọzọ, ndi nējeghari na npako, Ọ puru ime ka ha di ala.


Ma Ọ nēnye kari amara. N'ihi nka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ si, Chineke nēdo Onwe-ya imegide ndi-npako, ma Ọ nēnye ndi di ume-ala n'obi amara.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan