Ma ubọchi Onye-nwe-ayi gābia dika onye-ori; nke ọ bu nime ya ka elu-igwe gēji oké ùzù gabiga, ihe nile di n'elu-igwe gāb͕a kwa ọku we la n'iyì, uwa na ọlu nile aluru nime ya gērechapu kwa.
Ọ nēme ka onye nēnweghi ike si n'ájá bilie, Ọ nēsi n'ebe-ikpofu-ahihia welie ob͕eye elu, Ime ka ha na ndi-isi nọdu, Na ime ka ha keta oche-eze nsọpuru: N'ihi na Jehova nwe ogidi nile nke uwa, O dowo kwa elu-uwa dum madu bi n'elu ha.