Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 24:4 - Bible Nso

4 Ha nēsi n'uzọ wezuga ndi-ob͕eye: Ndi ewedara n'ala nke uwa ezobekowo onwe-ha n'otù.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Site nʼokporoụzọ ka ha na-akwapụ ndị nọ na mkpa. Ha na-ejikwa aka ike mee ka ndị ogbenye dị nʼala ahụ zoo onwe ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 24:4
22 Iomraidhean Croise  

Ìhè ututu ka ob͕u-madu ji bilie, o nēb͕u onye ewedara n'ala na ob͕eye; N'abali kwa ọ di ka onye-ori.


N'ihi na m'mere onye ewedara n'ala nke nētikum ka o wepuga onwe-ya, Ya na nwa-nb͕ei, bú onye nēnweghi onye nēyere ya aka.


Nna ka m'buru ndi-ob͕eye: Okwu-ikpé m'nāmaghi kwa, anamegwuputa ala-ya.


Àkwaghm ákwá n'ihi onye ubọchi-ya siri ike? Ò wuteghi nkpuru-obim bayere ob͕eye?


Ọ buru na eb͕ochiem ndi nēnweghi ike n'ihe nātọ ha utọ, Ọ buru kwa na emem ka anya nwayi di-ya nwuru dala n'isi;


Ọ buru na ahum madu nāla n'iyì site n'enweghi uwe, Ọ buru kwa na ob͕eye enweghi ákwà-nb͕okwasi;


N'ihi na o chetaghi ime ebere, O we sob͕ue nwoke ewedara n'ala na ob͕eye, Na onye obi-ya mebiri emebi, ime ka ha nwua.


Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú onye nwere uche n'imeso onye nēnweghi ike: N'ubọchi ihe ọjọ Jehova gēme ka ọ wepuga onwe-ya.


Onye nēmeb͕u onye nēnweghi ike nāta Onye kèworo ya uta: Ma onye nāsọpuru Ya ka onye nēme ob͕eye amara bu.


Onye nēmeb͕u onye nēnweghi ike ime ka àkù nke aka ya ba uba, Ya na onye nēnye ọgaranya ihe gābiaru nání ihe-ukọ.


Mb͕e obi ndi ezi omume nātọ ha utọ, ọtutu ima-nma di: Ma mb͕e ndi nēmebi iwu nēbili, agāchọ madu achọ.


Mb͕e ndi nēmebi iwu nēbili, madu ezobe onwe-ya: Ma mb͕e ha nāla n'iyì, ndi ezi omume aba uba.


Ọb͕ọ di, mma-agha ka ezé nile ha bu, ọ bu kwa mma ka ikiri-ezé-ha bu, Irichapu ndi ewedara n'ala n'uwa, na irichapu ndi-ob͕eye n'etiti madu.


iwezuga ndi nēnweghi ike n'ezi ikpé, na inapu ikpé ziri ezi nke ndi ewedara n'ala nke ndim, ka ndinyom di-ha nwuru we buru ihe ha kwatara n'agha, ka ha we luta kwa ihe umu-nb͕ei n'agha!


onye ewedara n'ala na ob͕eye ka o meworo ihe-ike, ọ punarawo madu ihe n'ike, ọ dighi-enyeghachi ihe-ibe, ọ bu kwa arusi nile ka o weliworo anya-ya abua le, ihe-árú ka o meworo,


Ma nna-ya, n'ihi na ọ meb͕uru nke-uku, punara nwa-nne-ya ihe n'ike, me ihe nke nādighi nma n'etiti ndi-ya, le, ọ gānwu kwa n'ajọ omume-ya.


Ndi ala nka emeb͕uwo emeb͕u, punara madu ihe n'ike; onye ewedara n'ala na ob͕eye ka ha meworo ihe-ike, ọ bu kwa ọbìa ka ha meb͕uworo n'ekpeghi ikpe.


ha bu ndi nēghekpọso ájá ala n'isi ndi nēnweghi ike, ọ bu kwa uzọ ndi di ume-ala n'obi ka ha nēwezuga: ọzọ, nwoke na nna-ya nējekuru otù nwa-ab͕ọghọ ahu, ka ha we me ka aha nsọm ghara idi nsọ:


Nurunu okwu a, unu nne-ehi nke Beshan, ndi nọ n'ugwu Sameria, ndi nēmeb͕u ndi nēnweghi ike, ndi nāzọpia umu-ob͕eye, ndi nāsi ndi-nwe-ha, Wetanu, ka ayi ṅua.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan