6 Ọ̀ bu n'uba ǹke ike-Ya ka O gēkpesom ikpe? É-è; kama Ya onwe-ya gēchem iru.
6 Ọ ga-eji ike dị egwu megide m? Mba, ọ gaghị ebo m ebubo.
Me ka ọbu-aka-Gi dipu n'arum n'ebe di anya; Ka oké ujọ-Gi ghara kwa ime ka m'tua egwu nke-uku.
Kam'mara okwu nile Ọ gāzaghachim, Ka m'ghọta kwa ihe Ọ gāsim.
Ọ buru na ayi ekwue okwu bayere ike nke onye nwe ume, le, Ọ nọ ya! Ma ọ buru na ayi ekwue okwu bayere ikpé, ònye gākaram mb͕e?
Ọ buru na ọ tọ ya utọ iso Ya je n'ikpé, Ọ gaghi-aza Ya otù okwu nime nnù okwu abua na ọgu iri.
O nwere obi nke mara ihe, Ọ nāb͕a kwa ume n'ike: Ònye mere onwe-ya ka o sie ike imegide Ya, we nọ n'udo?
N'ubọchi m'kpọkuru Gi ka I zaram, I nēji ike di na nkpuru-obim kpaliem.
Ọnuma adighi nimem: ọ gādim nọ̄ nma ma ogwu na uke gēmegidem n'agha! M'gāwaku ha, M'gēsurekọta ha n'otù.
N'ọtùtù, mb͕e I nēzilaga ya, ka Gi na ya nēse okwu: O jiwo ifufe-Ya siri ike wepu ya n'ubọchi ifufe Iru-anyanwu.
Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), n'ezie ọ bu aka di ike, ọ bu kwa ogwe-aka esetiri eseti, ọ bu kwa ọnuma awusiri awusi, ka M'gēji buru eze-unu:
M'gēme kwa ka unu bata n'ọzara nke ndi nile di iche iche, Mu na unu gēkpe kwa ikpe n'ebe ahu iru na iru.