4 Ka m'do ikpém n'usoro n'iru Ya, Meju kwa onum n'iru-uka.
4 Aga m edozi mkpesa m nʼusoro nʼihu ya were ịrụ ụka mejuo ọnụ m.
Ma Gi onwe-gi siri, Aghaghm ime gi nma, M'gēme kwa nkpuru-gi ka ọ di ka ájá nke oké osimiri, nke anāpughi iguta ọnu n'ihi ọtutu ọ di.
Biko, le, edowom ikpém n'usoro; Amawom na mu onwem bu onye ezi omume.
Ma mu onwem, Onye Nke puru ime ihe nile ka m'gāgwa okwu, Ọ nātọkwam utọ isoro Chineke ru uka.
Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na amaram ebe m'gāchọta Ya! Ma asi na agamabiaru ọnọdu-Ya guzosiri ike!
Kam'mara okwu nile Ọ gāzaghachim, Ka m'ghọta kwa ihe Ọ gāsim.
Me ka ayi mara ihe ayi gāsi Ya; Ayi adighi-edo okwu-ayi n'usoro n'ihi ọchichiri.
Onye nādọ aka na nti, ọ̀ nāluso Onye puru ime ihe nile ọ̀gù? Onye nābara Chineke nba, ya za ya.
N'ihi aha-Gi, Jehova, B͕aghara ajọ omumem, n'ihi na o riri nne.
Kpem ikpe, Chineke, kpe kwa ọnum n'ikpe, me ka m'pua n'aka mba nādighi-eme ebere: Me ka m'si n'aka nwoke bu onye-aghughọ na onye ajọ omume b͕apu.
Chetaram; ka ayi kpekọ ikpe: gi onwe-gi kọ akukọ-gi, ka ewe gua gi n'onye ezi omume.