Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 23:11 - Bible Nso

11 Nzọ-ukwu-Ya ka ukwum nējisi ike iso; Uzọ-Ya ka m'debeworo, adighm-ewezuga kwa onwem.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 ụkwụ m abụọ na-agbaso nzọ ụkwụ ya; ana m eso ụzọ ya na-atụgharịghị nʼaka nri maọbụ aka ekpe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 23:11
21 Iomraidhean Croise  

Ọ bu ezie na I mara na adighm-emebi iwu; Ọ dighi kwa onye ọ bula nānaputa n'aka-Gi.


Ma onye ezi omume gējisi ike n'iso uzọ-ya, Onye nke aka-ya abua di ọcha ganāga n'iru n'iru n'inwe ume.


Ọ buru na nzọ-ukwum esi n'uzọ wezuga onwe-ya, Ọ buru kwa na obim ejesowo anyam abua n'azu, Ọ buru kwa na ọlu ọ bula araparawo n'ọbu-akam abua:


Nkasi-obim we nādiru ub͕u a; M'we wulie elu n'ihe-nb͕u nke nādighi-enwe ọmiko: N'ihi na ezoghm okwu-ọnu nile nke Onye Nsọ.


Ndi-nganga akwawom emò nke-uku: Ma esighm n'iwu-Gi wezuga onwem.


Ma ndi nēwezuga onwe-ha ije n'uzọ nile ha b͕agọro ab͕agọ, Jehova gēme ka ha na ndi nālu ajọ ihe yikọ la. Ka udo dikwasi Israel.


Nzọ-ukwum nile ejidewo okporo-uzọ-Gi nile, Ewezugaghi ije-ukwum n'ọnọdu-ha.


Okwu nile nke ọnu-ya bu ajọ ihe na aghughọ: Ọ rapuwo inwe uche na ime nma.


Obi-ayi alaghachighi azu, Nzọ-ukwu-ayi esighi kwa n'uzọ-Gi wezuga onwe-ha;


Na I gwepiawo ayi n'ọnọdu nkita-ọhia, Were kwa onyinyo ọnwu kpuchie ayi.


Nweta amam-ihe, nweta nghọta; Echezọla, esi-kwa-la n'okwu nile nke ọnum wezuga onwe-gi:


na ndi si n'iso Jehova laghachi azu; na ndi nāchọghi Jehova, nājughi kwa ase Ya.


ndi site na ntachi-obi n'ezi ọlu nāchọ otuto na nsọpuru na apughi-imebi ka Ọ gēnye ndu ebighi-ebi:


N'ihi na inya-isi-ayi bu nka, àmà nke akọ-na-uche-ayi, na ọ bu n'idi-nsọ na idi-ọcha nke Chineke, ọ bughi n'amam-ihe nke anu-aru, kama ọ bu n'amara Chineke, ka ayi biri obi n'uwa, ma ọ bu n'ebe unu nọ ka ayi bikariri obi-ayi nke-uku.


Unu onwe-unu bu ndi-àmà, Chineke bu kwa onye-àmà, otú ahuru ayi na ayi bu ndi di ọcha n'obi na ndi ezi omume na ndi nādighi ita uta n'ebe unu nọ, bú ndi kwere ekwe:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan