ọ buru kwa na i weputara onye agu nāgu ihe nkpuru-obi-gi chọrọ, ọ buru na i me ka afọ ju nkpuru-obi ewedara n'ala; ìhè-gi gāwa nime ọchichiri, oké ọchichiri-gi gādi kwa ka etiti-ehihie:
Ọ̀ bughi ikèsara onye agu nāgu nri-gi, ka i me kwa ndi ewedara n'ala ndi nāwaghari awaghari ka ha bata n'ulo-gi? mb͕e i huru onye b͕a ọtọ, ka i kpuchie ya: ka i ghara kwa izonari onye-aru-gi onwe-gi?
nke nādighi-eme onye ọ bula ihe-ike, nke nēnyeghachi onye-ugwọ ihe-ibe-ya, nke nādighi-apunara madu ihe n'ike, nke nēnye onye-agu nri-ya, nke nēkpuchi onye-ọtọ uwe;
Ma ọ buru na agu nāgu onye-iro-gi, nāzù ya; ọ buru na akpiri nākpọ ya nku, gi me ka ọ ṅua miri: n'ihi na n'ime nka i gāgukwasi icheku nēre ọku n'isi-ya.