onye ewedara n'ala na ob͕eye ka o meworo ihe-ike, ọ punarawo madu ihe n'ike, ọ dighi-enyeghachi ihe-ibe, ọ bu kwa arusi nile ka o weliworo anya-ya abua le, ihe-árú ka o meworo,
nke nādighi-eme onye ọ bula ihe-ike, nke nēnyeghachi onye-ugwọ ihe-ibe-ya, nke nādighi-apunara madu ihe n'ike, nke nēnye onye-agu nri-ya, nke nēkpuchi onye-ọtọ uwe;
ọ bu kwa n'elu uwe anaraworo n'ihe-ibe ka ha nēseti onwe-ha n'akuku ebe-ichu-aja nile ọ bula, ọ bu kwa manya-vine nke ndi eriworo ha nra ka ha nāṅu n'ulo Chineke-ha.