Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 22:29 - Bible Nso

29 Mb͕e ha gēme ka i di ala, i gāsi, Nweli-elu di; Onye anya-ya ruru ala ka Ọ gāzọputa kwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

29 Mgbe a na-eweda ndị mmadụ ala, ọ bụrụkwa na ị sị, ‘Bulienụ ha elu,’ mgbe ahụ ọ ga-azọpụta ndị e wedara nʼala.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 22:29
17 Iomraidhean Croise  

Ọ dighi-esepu anya-Ya n'aru onye ezi omume: Ma ọbuná n'ebe ndi-eze nọ n'oche-eze Ka Ọ nēme ka ha nọkwasi rue mb͕e ebighi-ebi, ha we di elu.


Ido ndi di ala n'ebe di elu; Ndi nēyi uwe-nkpe nọ kwa n'elu nime nzọputa.


N'ihi na Jehova di elu, ma ọ bu onye di ume-ala n'obi ka Ọ nāhu anya: Ma onye-npako, Ọ nēsite n'ebe di anya mara ya.


Npako madu gēme ka ọ di ala: Ma onye mọ-ya di ala nējidesi nsọpuru ike.


N'ihi na otú a ka Ọ siri, bú Onye di elu, Nke eme-kwa-ra ka Ọ di elu, Onye nēbi ebi mb͕e nile ebighi-ebi, Onye Nsọ ka aha-Ya bu kwa: Ọ si, N'ebe di elu di kwa nsọ ka M'bi, M'biye-kwa-ra onye mọ-ya bu ihe azọpiara azọpia di kwa ala, ime ka mọ nke ndi di ume-ala n'obi di ndu, na ime ka obi nke ndi azọpiara azọpia nime mọ-ha di ndu.


N'ihi na ihe nile ndia ka akam meworo, ihe ndia nile ewe di, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: ma onye a ka M'gēlegide, ọbuná onye ewedara n'ala nke etib͕u-kwa-ra mọ-ya etib͕u, onye nāma kwa jijiji n'okwum.


Ma onye ọ bula nke gēweli onwe-ya elu, agēweda ya; onye ọ bula nke gēweda kwa onwe-ya, agēweli ya elu.


O wedawo ndi di ike pua n'oche-eze-ha, Weli kwa elu ndi ọnọdu-ha di ala.


N'ihi na onye ọ bula nke nēweli onwe-ya elu, agēweda ya; ọzọ, onye nēweda onwe-ya, agēweli ya elu.


Ma Ọ nēnye kari amara. N'ihi nka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ si, Chineke nēdo Onwe-ya imegide ndi-npako, ma Ọ nēnye ndi di ume-ala n'obi amara.


Otú ahu, unu ndi bu nwata, donu onwe-unu n'okpuru ndi-okenye. Ma unu nile were obi di ume-ala ke onwe-unu dika ákwà, ijerita ibe-unu ozi: n'ihi na Chineke nēdo Onwe-ya imegide ndi-npako, ma Ọ nēnye ndi di ume-ala n'obi amara.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan