Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 22:27 - Bible Nso

27 I gāriọ Ya aririọ, Ọ gānu kwa gi; I gākwughachi kwa nkwa-gi nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

27 Ị ga-ekpe ekpere, ọ ga-azakwa gị ekpere gị, ị ga-emezukwa nkwa i kwere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 22:27
22 Iomraidhean Croise  

Jehoahaz we chọ ime ka iru Jehova dajua, Jehova we ge ya nti: n'ihi na Ọ huru nmeb͕u Israel, n'ihi na eze Siria meb͕uru ha.


Jebez we kpọkue Chineke Israel, si, Ọ gādim nọ̄ nma ma ọ buru na I gọziem n'ezie, me kwa ka ókè-alam rie nne, ọ buru kwa na aka-Gi gādiyerem, I we me ka m'pua n'ihe ọjọ, ka ọ ghara iwutam! Chineke we me ka ihe nke ọ riọrọ biarue ya aru.


O we kpere Ya; O we kwe ka ọ riọta ihe ọ riọrọ, we nuru aririọ-amara-ya, me ka ọ lata na Jerusalem ba n'ala-eze-ya. Manase we mara na Jehova, Ya onwe-ya, bu Chineke.


Ọ buru na gi onwe-gi edozie obi-gi, We b͕asa ọbu-aka-gi abua n'ebe Ọ nọ;


Ìhe nke Onye puru ime ihe nile gātọ ya utọ? Ọ̀ gākpọku Chineke na mb͕e nile?


Ọ nāriọ Chineke aririọ, ihe-ya we nātọ Ya utọ; O we were iti-nkpu-ọṅù hu iru-Ya: O we nyeghachi madu ezi omume-ya.


Ime ka iti-nkpu nke onye nēnweghi ike biarue Ya ruo, Iti-nkpu nke ndi ewedara n'ala ka Ọ nānu kwa.


Ọ buru na onye di ọcha n'obi na onye ziri ezi ka i bu; N'ezie ub͕u a Ọ gētetara gi, Me ka ebe-obibi nke ezi omume-gi di n'udo.


Ahurum Jehova n'anya, n'ihi na Ọ nānu Olum, bú aririọ-amaram nile.


Ka m'kwughachi Jehova nkwa nile m'kwere, Ka m'kwughachi ha n'iru ndi-Ya nile.


N'isim, Chineke, ka nkwa nile m'kwere Gi di: M'gākwughachi Gi ekele nile.


N'ihi na Gi onwe-gi, Chineke, egewo nti nkwa nile m'kwere: I werewo ihe-nnweta nke ndi nātu egwu aha-Gi nye ha.


Ọ gākpọkum, M'gāza kwa ya; Mu onwem gānọyere ya n'ahuhu: M'gādọputa ya, sọpuru kwa ya.


Mb͕e i nēkwe Chineke nkwa, alala azu n'ikwughachi ya; n'ihi na ihe ndi-nzuzu adighi-atọ Ya utọ: ihe i nēkwe na nkwa, kwughachi ya.


Mb͕e ahu ka i gākpọ òkù, Jehova gāza kwa; i gētiku Ya, Ọ gāsi kwa, Lekwam. Ọ buru na i si n'etiti gi wezuga yoke ahu, na nsetipu nkpisi-aka, na ikwu ajọ ihe;


Unu gākpọkukwam, je kperem ekpere, M'gēge kwa unu nti.


Ma mu onwem gēji olu ekele chuara Gi àjà; Ihe nke m'kweworo na nkwa ka m'gākwughachi. Nzọputa diri Jehova.


Mb͕e i gēkwe Jehova, bú Chineke-gi, nkwa, alala azu n'ikwughachi ya: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, aghaghi iju ase ya n'aka-gi; ọ gābu kwa nmehie nime gi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan